Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

‘E Kwesịrị Iweliri Ha Aka Elu n’Ihi na Ha Jụrụ Ịkwado Ihe Na-adịghị Mma’

‘E Kwesịrị Iweliri Ha Aka Elu n’Ihi na Ha Jụrụ Ịkwado Ihe Na-adịghị Mma’

‘E Kwesịrị Iweliri Ha Aka Elu n’Ihi na Ha Jụrụ Ịkwado Ihe Na-adịghị Mma’

MGBE onye Jamanị bụ́ Adolf Hitler na-achị ọchịchị nchigbu ya, e nwere ọtụtụ puku akwụkwọ ozi ndị mmadụ degaara ya. N’afọ 1945, mgbe ndị Rọshịa weghachaara Belin na obodo ndị gbara ya gburugburu, e kpogara ọtụtụ n’ime akwụkwọ ozi ndị ahụ Mọsko ma dowe ha ebe ahụ. Ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Henrik Eberle lebara anya n’ọtụtụ n’ime akwụkwọ ozi ndị ahụ ka o lee ma ọ̀ ga-amata ndị dere ha na ihe mere ha ji dee ha. Eberle dere ihe ndị ọ chọpụtara n’akwụkwọ ya bụ́ Briefe an Hitler (Akwụkwọ Ozi Ndị E Degaara Hitler).

Eberle kwuru, sị: “Ndị nkụzi na ụmụ akwụkwọ, ndị ụkọchukwu na ndị sista, ndị na-enweghị ọrụ na ndị o ji ego achụ nta ego, ndị isi ndị agha mmiri na ndị soja nkịtị, degachaara Hitler akwụkwọ ozi. Ụfọdụ nọ na-eto ya, na-asị na ọ bụ Mesaya; ebe ndị ọzọ nọ na-asị na ọ bụ Ekwensu n’onwe ya.” Ndị isi chọọchị dị iche iche hà degaara Hitler akwụkwọ ozi iji gwa ya na ihe ndị Nazi na-eme adịghị mma? Ụfọdụ dere, ma ha dị ole na ole.

Ma, n’ebe ahụ e dowere akwụkwọ ozi ndị ahụ na Mọsko, Eberle hụrụ otu faịlụ ọtụtụ akwụkwọ ozi juru n’ime ya. Ọ bụ Ndịàmà Jehova bi n’ebe dị iche iche na Jamanị dere akwụkwọ ozi ndị ahụ. Ha nọ na-agwa Hitler na ihe ndị Nazi na-eme adịghị mma. Nke bụ́ eziokwu bụ na Ndịàmà Jehova ndị bi n’ihe dị ka mba iri ise zigaara Hitler akwụkwọ ozi na telegram dị ihe dị ka puku iri abụọ, na-agwa ya na ihe a na-eme Ndịàmà Jehova adịghị mma. N’oge ahụ, e nwere ọtụtụ puku Ndịàmà Jehova ndị Nazi nwụchiri, gbuokwa ọtụtụ narị mmadụ n’ime ha, ụfọdụ anwụọkwa n’ihi ahụhụ ha tara ha. Eberle kwuziri, sị: ‘Ndịàmà Jehova e gburu na ndị nke a tara ahụhụ ebughị ibu ma e were ha tụnyere ọtụtụ nde mmadụ e gburu egbu na ndị a tara ahụhụ n’oge ọchịchị ndị Nazi. Ma, e kwesịrị iweliri ha aka elu n’ihi otú ha si jikọọ aka jụ ịkwado ihe na-adịghị mma ọchịchị ndị Nazi nọ na-eme.’