Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Mgbe Anyị Kwesịrị Ịmụrụ Anya?

Olee Mgbe Anyị Kwesịrị Ịmụrụ Anya?

Kụziere Ụmụ Gị Ihe

Olee Mgbe Anyị Kwesịrị Ịmụrụ Anya?

Ọ BỤRỤ na a jụọ gị ma ọ̀ dị mkpa ka nwata akwụkwọ mụrụ anya mgbe a na-amụ ihe n’ụlọ akwụkwọ, o doro anya na ị ga-asị na ọ dị mkpa. Ọtụtụ ụmụ akwụkwọ na-ehi ụra mgbe a na-akụzi ihe na klas. Ma, ọ bụrụ na ị chọrọ ịmụta ihe a na-akụzi, i kwesịrị ịmụrụ anya. O nwere ike ịbụ na e nwere ebe ị na-aga amụ Baịbụl.

Gịnị ka i chere ị ga-eme ka i nwee ike mụrụ anya mgbe i kwesịrị ịmụrụ anya? * Otu ihe nwere ike inyere gị aka bụ ịna-alaba ụra n’oge. Ihitụ ụra n’ehihie nwekwara ike inyere gị aka. Ka anyị hụ ihe anyị nwere ike ịmụta n’ihe mere otu nwa okorobịa ụra buuru mgbe Pọl onyeozi nọ na-akụzi ihe otu ụbọchị ruo mgbe chi jimiri. Were Baịbụl gị gụọ Ọrụ Ndịozi isi nke 20, amaokwu nke 7 ruo nke 12 ka ị mata ihe merenụ.

N’oge ahụ, Pọl nọ na-eleta ọgbakọ ndị dị na Troas, nke bụ́ obodo e nwere ọdụ ụgbọ mmiri na ya. Baịbụl kwuru na Pọl ga-eso ụgbọ mmiri ‘pụọ n’echi ya.’ N’ihi ya, “o kwugidere okwu ruo etiti abalị.” Baịbụl sịrị: “Otu nwa okorobịa aha ya bụ Yutikọs nọ ọdụ na windo, oké ụra wee buru ya mgbe Pọl nọ na-ekwu okwu.” Oleezi ihe merenụ?

Yutikọs si na windo ahụ, bụ́ nke dị ‘n’okpukpu nke atọ nke ụlọ’ ahụ daa. Pọl na ndị ọzọ ji ọsọ si n’ụlọ elu ahụ gbatuo. Mgbe ha rutere, Yutikọs tọgbọ n’ala. Ọ nwụọla! Olee otú i chere obi dị ndị niile nọ ebe ahụ?— Baịbụl kwuru na Pọl kuuru Yutikọs ma makụọ ya. O teghị aka, Pọl ejiri obi ụtọ kwuo, sị: ‘Unu ebezila ákwá, ọ dịla ndụ!’ Chineke emeela ka Yutikọs dịghachi ndụ!

Gịnị ka ihe ahụ mere Yutikọs na-akụziri anyị banyere Chineke?— Otu ihe ọ na-akụziri anyị bụ na Nna anyị nke eluigwe bụ́ Jehova nwere ike ime ka ndị nwụrụ anwụ dịghachi ndụ, ma ụmụaka. Jehova ma otú obi dị gị karịa otú papa gị na mama gị ma, ọ hụkwara gị n’anya karịa otú ha hụrụ gị. Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, o kuuru ụmụaka ma gọzie ha. Nke a mere ka anyị mata na Nna ya hụkwara ụmụaka n’anya. Jizọs kpọlitekwara ndị na-eto eto n’ọnwụ. Otu nwata nwaanyị dị afọ iri na abụọ so ná ndị ọ kpọlitere.

Olee otú obi dị gị ugbu a ị matara na Nna gị nke eluigwe hụrụ gị n’anya?— Nke a kwesịrị ime ka anyị hụkwa Jehova n’anya ma na-eme ihe O kwuru. Ị̀ ma otú anyị nwere ike isi gosi na anyị hụrụ Jehova n’anya?— Otu ihe anyị ga-eme bụ ịna-ekwu na anyị hụrụ ya n’anya. Jizọs kwuru, sị: “M hụrụ Nna m n’anya.” Ma, Jizọs ekwughị naanị n’ọnụ na ya hụrụ Chineke n’anya. Ihe ndị o mere gosiri na ọ hụrụ ya n’anya n’eziokwu.

Jizọs rubeere Chineke isi. Jizọs kwuru, sị: “M na-eme ihe dị ya mma mgbe niile.” Ọ bụrụkwa na anyị na-erubere Jehova isi ka anyị wee mee ya na Ọkpara ya bụ́ Jizọs obi ụtọ, anyị ga-agbalịsi ike na-amụrụ anya mgbe anyị nọ n’ụlọ akwụkwọ na mgbe anyị gara ebe anyị na-amụ Baịbụl.

Gụọ ebe ndị a na Baịbụl gị

Ọrụ 20:7-12

Luk 8:49-56

Jọn 8:29; 14:31

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 Ọ bụrụ nwatakịrị ka ị na-agụrụ akụkọ a, akara ùhiè ndị dị n’isiokwu a na-echetara gị ka ị kwụsịtụ gbaa ya ume ka ọ zaa ajụjụ ndị ahụ.