Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ònye Bụ Ebreham?

Ònye Bụ Ebreham?

Ònye Bụ Ebreham?

N’OKPUKPE dị iche iche e nwere n’ụwa, ọ bụ naanị mmadụ ole na ole ka a na-ekwutekarị okwu ha otú e si ekwute okwu Ebreham. Ndị Juu na ndị Alakụba anaghị eji Ebreham * egwuri egwu, ọ bụkwa otú ahụ ka ọ dị Ndị Kraịst. Ọ bụ ya mere e ji sị na Ebreham bụ “nnukwu mmadụ nke a kọrọ akụkọ ya n’Akwụkwọ Nsọ” nakwa “onye e ji okwukwe ya ama atụ.” Baịbụl kpọrọ ya “nna nke ndị niile nwere okwukwe.”—Ndị Rom 4:11.

Gịnị mere e ji jiri Ebreham kpọrọ ihe otú a? Otu ihe kpatara ya bụ na ọ bụ naanị Ebreham ka Baịbụl kpọrọ enyi Chineke.—Aịzaya 41:8; Jems 2:23.

Ma a bịa n’ihe ndị ọzọ, anyị na Ebreham bụ otu. E nwere ọtụtụ nsogbu ndị anyị na-enwe taa ndị Ebreham nwekwara, ma o diri ha niile. Ị̀ ga-achọ ịma otú o si die ha? Ka anyị leba anya n’ihe Baịbụl kwuru banyere nwoke a.

Ebe Ebreham Nọ Too

A mụrụ Ebreham n’afọ 2018 Tupu Oge Anyị. O tokwara n’obodo Ọọ. (Jenesis 11:27-31) Ọọ bụ nnukwu obodo nke ọtụtụ ndị bi na ya bara ọgaranya. Ọtụtụ n’ime ha na-efekwa arụsị. O nwekwara ike ịbụ na nna Ebreham, bụ́ Tira, so ná ndị ahụ na-efe arụsị. (Jọshụa 24:2) Ma, Ebreham kpebiri na ya agaghị efe arụsị, kama na ọ bụ naanị Jehova * ka ya ga-efe.

Gịnị mere Ebreham ji kpebie ife Jehova? Shem, bụ́ nwa Noa, na Ebreham dịkọrọ ndụ. Ọ nwụrụ mgbe Ebreham dị otu narị afọ na iri afọ ise. Ọ bụrụ na Ebreham na Shem nọrọ, olee ihe ndị o nwere ike ịbụ na Ebreham mụtara n’aka ya? O nwere ike ịbụ na Shem kọọrọ Ebreham otú Chineke si zọpụta ha n’oge ahụ e nwere Iju Mmiri n’ụwa. O nwekwara ike ịbụ na Ebreham mụtara na ọ dị mma ka ya fee Jehova, bụ́ Chineke ahụ chebere Shem na ndị ezinụlọ nna ya.

Ma Ebreham ò si n’ọnụ Shem nụ banyere ezi Chineke ma ò si ebe ọzọ nụ ya, ihe ọ nụrụ masịrị ya. Jehova, bụ́ onye “na-enyocha obi,” hụrụ ihe dị mma n’obi Ebreham, o nyekwaara Ebreham aka ka ọ na-emekwu ihe dị mma.—Ilu 17:3; 2 Ihe E Mere 16:9.

Ihe Ndị Mere ná Ndụ Ya

E nwere ọtụtụ ihe mere ná ndụ Ebreham. Ọtụtụ mgbe, ihe sikwaara ya ike, ma ihe ndị ahụ emeghị ka ike ụwa gwụ ya. Ka anyị lebagodị anya n’ụfọdụ n’ime ha.

Mgbe Ebreham bi na Ọọ, bụ́ obodo a mụrụ ya, Chineke gwara ya ka ọ hapụ ebe ahụ gawa ebe Ya ga-egosi ya. N’agbanyeghị na Ebreham na Sera amaghị ebe ha na-aga ma ọ bụkwanụ ihe mere Chineke ji sị ha hapụ obodo ahụ, ha mere ihe Chineke gwara ha. Ebreham na Sera mechaziri biri n’ụlọikwuu dị ka ọbịa n’ala Kenan ruo mgbe ha nwụrụ.—Ọrụ 7:2, 3; Ndị Hibru 11:8, 9, 13.

Mgbe Ebreham na Sera na-amụtabeghị nwa, Jehova kwere Ebreham nkwa na ya ga-eme ka ọ ghọọ nnukwu mba. Jehova kwukwara na ya ga-esi n’aka Ebreham gọzie ezinụlọ niile nke ụwa. (Jenesis 11:30; 12:1-3) Jehova mechakwara gosi ya na ya ga-emezu nkwa ahụ. Ọ gwara Ebreham na ụmụ ya ga-adị ọtụtụ ka kpakpando niile dị n’eluigwe.—Jenesis 15:5, 6.

Mgbe Ebreham dị afọ iri itoolu na itoolu, ya afọkwa obere ka Sera ruo afọ iri itoolu, Jehova kwere ha nkwa na ha ga-amụta nwa nwoke. Ọ bụ eziokwu na nke ahụ yiri ihe na-agaghị ekwe omume, Ebreham na Sera mechara chọpụta na ‘ọ dịghị ihe nyịrị Jehova.’ (Jenesis 18:14) Mgbe otu afọ gara, bụ́ mgbe Ebreham dị otu narị afọ, Sera mụụrụ ya nwa nwoke, bụ́ onye ọ gụrụ Aịzik. (Jenesis 17:21; 21:1-5) Chineke kwukwara na ọ bụ n’aka Aịzik ka ya ga-esi gọzie mmadụ niile.

Mgbe ọtụtụ afọ gara, Jehova gwara Ebreham ka o mee otu ihe Ebreham na-echetụdịghị n’echiche na ọ ga-agwa ya mee. Ọ gwara ya ka o jiri nwa ya ọ hụrụ n’anya bụ́ Aịzik chụọrọ ya àjà, n’agbanyeghị na Aịzik alụbeghị nwaanyị ma ọ bụ mụta nwa. * Ọ bụ eziokwu na ọ ga-ewute Ebreham ma Aịzik nwụọ, o kwetara ime ihe Chineke gwara ya. Ebreham kwenyesiri ike na ọ bụrụgodị na Aịzik anwụọ, Chineke ga-akpọliteli Aịzik n’ọnwụ ka nkwa Chineke kwere wee mezuo. (Ndị Hibru 11:19) Ozugbo Ebreham chọrọ igbu nwa ya, Chineke gwara ya egbula ya. Chineke jara Ebreham mma maka irubere ya isi, gwakwa ya ọzọ na ya ga-emezu nkwa ahụ o kwere.—Jenesis 22:1-18.

Ebreham nwụrụ mgbe ọ dị otu narị afọ na iri afọ asaa na ise. Baịbụl kwuru na ‘ọ nwụrụ n’ezigbo agadi, kaa nká ma nwee afọ ojuju.’ (Jenesis 25:7, 8) Ebreham ji anya ya hụ otú Chineke si mezuo nkwa ọzọ o kwere ya, nke bụ́ na ọ ga-eme ezigbo agadi ma nwụọ n’udo.—Jenesis 15:15.

Uru Akụkọ Ndụ Ya Baara Anyị

Ihe mere e ji kọọ akụkọ Ebreham na Baịbụl nakwa n’akwụkwọ ndị ọzọ abụghị naanị ka anyị mara na e nwere onye bụ́ Ebreham. Ihe ndị a kọrọ banyere ya baara anyị ezigbo uru taa n’ihi na e nwere ọtụtụ ihe anyị ga-amụta n’aka ya. (Ndị Hibru 11:8-10, 17-19) Ka anyị leba anya n’àgwà anọ ndị so n’àgwà ọma ndị e ji mara Ebreham. Anyị ga-ebido na nke yiri ka ọ̀ bụ ya ka a kacha mara amara, ya bụ, okwukwe ya.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 2 Aha Ebreham na-azabu bụ Ebram, nwunye ya na-azabukwa Seraị. Chineke mechara gụgharịa ya Ebreham, nke pụtara “Nna nke Ìgwè Mba Dị Iche Iche,” gụgharịakwa nwunye ya Sera, nke pụtara “Nne Ndị Eze.” (Jenesis 17:5, 15) N’isiokwu a na n’isiokwu ndị na-esonụ, anyị ga-akpọ ha Ebreham na Sera.

^ par. 6 Baịbụl kwuru na Jehova bụ aha Chineke.

[Igbe dị na peeji nke 4]

Onye E Si n’Akụkọ Ya Mata Ihe Ụfọdụ Dị Mkpa A Kọrọ na Baịbụl

Malite n’isi mbụ nke akwụkwọ Jenesis ruo n’isi ya nke iri, a kọrọ banyere ọtụtụ ndị nwere okwukwe na Chineke, ndị dị ka Ebel, Inọk, na Noa. Ma, malite n’isi nke iri na otu ruo n’isi nke iri abụọ na ise, ọ bụ naanị akụkọ Ebreham ka a kọrọ.

Ọ bụ mgbe a na-akọ akụkọ Ebreham bụ oge mbụ e kwuru ihe ụfọdụ dị ezigbo mkpa e kwuru na Baịbụl. Dị ka ihe atụ, ọ bụ mgbe a na-akọ akụkọ Ebreham bụ mgbe mbụ . . .

▪ e kwuru na Chineke bụ Ọta, ma ọ bụ Onye na-echebe ndị ya.—Jenesis 15:1; gụọkwa Diuterọnọmi 33:29; Abụ Ọma 115:9; Ilu 30:5.

▪ e kwuru banyere inwe okwukwe n’ebe Chineke nọ.Jenesis 15:6.

▪ e dere okwu ahụ bụ́ onye amụma na Baịbụl.—Jenesis 20:7.

▪ e kwuru banyere ịhụnanya nna na-enwe n’ebe nwa ya nọ.—Jenesis 22:2.