Ị̀ Maara?
Ị̀ Maara?
Ọ̀ bụ eziokwu na ndị mmadụ na-egbu ọjà n’ebe a na-eli ozu n’oge Jizọs nọ n’ụwa?
▪ Baịbụl kwuru na ndị mmadụ na-egbu ọjà n’oge a na-eme ememme. (1 Ndị Eze 1:40; Aịzaya 5:12; 30:29) O kwukwara na ndị mmadụ na-egbu ọjà n’ebe a na-eli ozu. Ma, ọ bụ naanị ọjà ka o kwuru na a na-egbu n’ebe ahụ. Akwụkwọ Matiu kwuru na otu nwoke onye Juu, bụ́ onye ọchịchị, gwara Jizọs ka ọ bịa gwọọ nwa ya nwaanyị nke nọ n’ọnụ ọnwụ. Ma mgbe Jizọs rutere n’ụlọ nwoke ahụ, ọ ‘hụrụ ndị na-egbu ọjà nakwa ìgwè mmadụ ka ha nọ n’ọgba aghara,’ n’ihi na nwa ahụ anwụọla.—Matiu 9:18, 23.
Matiu kwuru na ndị mmadụ nọ na-egbu ọjà n’oge ahụ. Ihe a o kwuru ọ̀ bụ eziokwu? Otu onye nsụgharị Baịbụl, nke aha ya bụ William Barclay, kwuru, sị: “N’ọtụtụ ebe n’oge ochie, dị ka na Rom, Gris, Finishia, Asiria, nakwa n’Izrel, ndị mmadụ na-egbu ọjà, jiri ya na-abụ abụ iru uju ma mmadụ nwụọ ma ọ bụ ma e nwee ọdachi.” Akwụkwọ okpukpe ndị Juu bụ́ Talmud kwuru na n’oge ochie, onye Juu ọ bụla nwunye ya nwụrụ na-akpọ mmadụ abụọ na-egbu ọjà na otu nwaanyị ọrụ ya bụ ịkwa ákwá arịrị ka ha bịa ruoro ya uju. Ọ bụrụgodị na nwoke ahụ bụ ogbenye ọnụ ntụ, ọ na-akpọ ndị ahụ ma kwụọ ha ụgwọ ka ha ruoro ya uju. Otu ọkọ akụkọ ihe mere eme, bụ́ Flavius Josephus, onye dịrị ndụ n’ihe dị ka puku afọ abụọ gara aga, kwuru na mgbe ozi rutere Jeruselem na ndị Rom emeriela obodo a na-akpọ Jotapata ma gbuchapụ ndị bi na ya n’afọ 67 Oge Anyị, “ọtụtụ ndị mmadụ nwụnahụrụ kpọrọ ndị na-egbu ọjà ka ha bịa gbuoro ha ọjà mgbe ha na-abụ abụ iru uju ha ji eli ndị nwụnahụrụ ha.”
Gịnị bụ ihe ọjọọ ndị omekome ahụ a kpọgburu ha na Jizọs mere?
▪ Baịbụl kpọrọ ndị omekome ahụ ndị “na-apụnara mmadụ ihe.” (Matiu 27:38; Mak 15:27) Akwụkwọ ụfọdụ na-akọwa okwu ndị dị na Baịbụl sịrị na e nwere aha dị iche iche a na-akpọ ndị omekome n’Akwụkwọ Nsọ. Nke ọ bụla n’ime aha ndị ahụ a na-akpọ ha na-egosi ụdị onye omekome nke a na-ekwu okwu ya. N’asụsụ Grik, ihe a na-akpọ onye ohi nke na-ezoro ezoro ezu ohi bụ kleptes. Ọ bụ ụdị ohi a ka e kwuru na Judas Iskarịọt zuru n’ihi na ọ na-ezoro ezoro ezu ego dị n’igbe ego ndị na-eso ụzọ Jizọs. (Jọn 12:6) Ma, ihe a na-akpọ onye ohi nke na-anaghị ezo ohi nke ya ezo bụ lestes n’asụsụ Grik, ọ bụkwa ihe e nwere ike ịkpọ onye na-ezuru ihe mmadụ n’ike ma ọ bụ onye na-enupụrụ ndị ọchịchị isi ma ọ bụkwanụ onye na-agba ọchịchị mgba okpuru. Ọ bụ ụdị ndị ohi a ka ndị ahụ a kpọgburu ha na Jizọs bụ. Otu n’ime ha kwudịrị, sị: “Anyị na-anatazu ihe kwesịrị anyị maka ihe ndị anyị mere.” (Luk 23:41) Nke a na-egosi na ọ bụghị naanị ohi ka ha zuru.
A kpọkwara ụdị ohi Barabas zuru lestes, ọ bụkwa ụdị ohi mmadụ abụọ ahụ a kpọgburu ha na Jizọs zuru. (Jọn 18:40) Luk 23:19 gosiri na ọ bụghị naanị ohi ka Barabas zuru n’ihi na amaokwu a sịrị na “a tụbara [ya] n’ụlọ mkpọrọ n’ihi na ọ kpaliri ndị mmadụ imegide ọchịchị n’obodo ahụ, nakwa n’ihi igbu ọchụ.”
N’ihi ya, ọ bụ eziokwu na ndị omekome ahụ a kpọgburu ha na Jizọs zuru ohi, ọ ga-abụ na ha gbara ọchịchị mgba okpuru ma ọ bụdị ya abụrụ na ha gburu mmadụ. Nke ọ bụla ọ bụ, gọvanọ bụ́ Pọntiọs Paịlet, kpebiri na ya ga-akpọgbu ha n’osisi maka ihe ọjọọ ha mere.