Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ
Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ
GỊNỊ ka otu nwoke bụ́ onye Skọtland chọpụtara na ọ baara ya uru karịa ịbụ ezigbo onye ọchụnta ego? Gịnị mere otu nwoke na Brazil ji kwụsị ịṅụ koken, kwụsịkwa ndụ rụrụ arụ ọ na-ebi? Gịnị nyeere otu nwoke na Slovinia aka ịkwụsị ịṅụ oké mmanya? Gụọ ihe ha kwuru.
“Echere m na m na-ekpori ndụ.”—JOHN RICKETTS
A MỤRỤ M N’AFỌ: 1958
ABỤ M ONYE: SKỌTLAND
NDỤ M BIRI: ABỤ M EZIGBO ONYE ỌCHỤNTA EGO
NDỤ M BIRI NA MBỤ: A mụrụ m n’ezinụlọ bara ọgaranya. Papa m bụ onye soja ndị Briten, n’ihi ya, ezinụlọ anyị biri n’obodo dị iche iche. E wezụga Skọtland, anyị bikwara n’Ingland, Jamanị, Kenya, Malesha, Ayaland, na Saịprọs. Mgbe m dị afọ asatọ, m malitere ịga ụlọ akwụkwọ a na-ebi ebi nke dị na Skọtland. M mechara gaa Mahadum Kembrij.
Mgbe m dị afọ iri abụọ, m malitere ịzụ ahịa mmanụ ụgbọala. Azụrụ m ahịa ahụ afọ asatọ. Ebe mbụ m zụrụ ahịa a bụ n’Ebe Ndịda Amerịka, mechaakwa zụọ ya n’Afrịka nakwa n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ọstrelia. Mgbe m kwagara Ọstrelia, emepere m otu ụlọ ọrụ m mechara ree.
Nnukwu ego m retara ụlọ ọrụ ahụ mere ka m kwụsị ịrụ ọrụ mgbe m gbara iri afọ anọ. Ebe ọ bụ na anaghịzi m arụ ọrụ, ejiri m oge m niile na-aga ebe dị iche iche. Eji m ọgba tum tum gbaa obodo Ọstrelia gburugburu ugboro abụọ. Agakwara m ọtụtụ ebe n’ụwa. Echere m na m na-ekpori ndụ.
OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M: Tupu mụ akwụsị ọrụ, m chọrọ otú m ga-esi ekele Chineke n’ihi otú ihe si dịrị m ná mma. Amalitere m ịga Chọọchị Anglịkan, bụ́ chọọchị m gara mgbe m dị obere. Ma chọọchị a akụzichaghịrị m Baịbụl. Akwụsịrị m ịga Chọọchị Anglịkan gawazie chọọchị ndị Mọmọn. Ma chọọchị a gbụrụ m n’ihi na ha anaghị akụzi ihe si na Baịbụl.
Otu ụbọchị, Ndịàmà Jehova bịara n’ụlọ m. Aghọtara m ozugbo na ihe niile ha na-akụzi si na Baịbụl. Ha gụụrụ m 1 Timoti 2:3, 4. Ebe ahụ kwuru na ọ bụ uche Chineke ka “a zọpụta ụdị mmadụ niile, ka ha nwetakwa ezi ihe ọmụma nke eziokwu.” Otú Ndịàmà Jehova ahụ si mee ka m ghọta ihe dị iche n’ezi ihe ọmụma Baịbụl na ihe ọmụma nkịtị masịrị m.
Amụtara m ezi ihe ọmụma ahụ dị na Baịbụl mgbe mụ na Ndịàmà Jehova mụwara Baịbụl. Dị ka ihe atụ, amụtara m na Chineke dị iche na Jizọs, na ha esoghị n’Atọ n’Ime Otu dị mgbagwoju Jọn 14:28; 1 Ndị Kọrịnt 11:3) Obi tọrọ m ụtọ mgbe m mụtara na Chineke dị iche na Jizọs. O wutere m na egbuola m ezigbo oge ebe m na-achọ ịghọta ozizi Atọ n’Ime Otu dị mgbagwoju anya!
anya ndị mmadụ na-akụzi. (N’oge na-adịghị anya, amalitere m ịga ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova. Àgwà ọma ha na otú ha si hụ ibe ha n’anya masịrị m. Ha dịcha ka ndị nsọ. Otú ha si jiri obi ha niile hụ ibe ha n’anya mere ka m ghọta na okpukpe ha bụ ezigbo okpukpe.—Jọn 13:35.
URU NDỊ M RITERELA: Mgbe e mechara m baptizim, ahụrụ m otu ọmarịcha nwa agbọghọ aha ya bụ Diane. Ndị mụrụ ya bụ Ndịàmà Jehova. Diane nwekwara àgwà ọma ndị masịrị m. Anyị mechara lụọ. Otú Diane si na-akwado m na otú o si hụ m n’anya gosiri na ọ bụ ezigbo onyinye Jehova nyere m.
Mụ na nwunye m chọsiri ike ịga kwusaa ozi ọma n’ebe a chọkwuru ndị na-ekwusa ozi ọma. N’ihi ya, n’afọ 2010, anyị kwagara Beliiz. N’ebe a, anyị na-ekwusara ndị hụrụ Chineke n’anya ma chọọ ịmụtakwu ihe Baịbụl na-akụzi ozi ọma.
Obi eruola m ala ugbu a m matara nke bụ́ eziokwu banyere Chineke na Okwu ya bụ́ Baịbụl. Ebe m bụ onye na-ekwusa ozi ọma oge niile, akuzierela m ọtụtụ ndị Baịbụl, nke a na-enyekwa m ọṅụ. Ihe kacha eme m obi ụtọ bụ ịhụ otú eziokwu dị na Baịbụl si agbanwe ndụ ndị mmadụ otú ahụ ọ gbanwere nke m. Emechaala m chọta ụzọ kacha mma m ga-esi ekele Chineke maka ndụ o nyere m.
“Ha nyeere m ezigbo aka.”—MAURÍCIO ARAÚJO
A MỤRỤ M N’AFỌ: 1967
ABỤ M ONYE: BRAZIL
NDỤ M BIRI: EBIRI M NDỤ RỤRỤ ARỤ
NDỤ M BIRI NA MBỤ: A mụrụ m n’obodo Avari, nke bụ́ obere obodo dị na Saụ Paụlo. Ọtụtụ ndị bi na ya bụ ndị ogbenye.
Papa m nwụrụ mgbe mama m dị ime m. Oge m dị obere, ana m eyi uwe mama m ma ọ pụọ. M malitere ime ka ụmụ nwaanyị. Nke a mere ka ndị mmadụ chewe na m na-edina ụmụ nwoke ibe m. E mechara mụ na ụmụ nwoke ibe m enwewe mmekọahụ.
Mgbe ọ fọrọ obere ka m ruo iri afọ abụọ, m na-achọgharị ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwaanyị mụ na ha ga-enwe mmekọahụ. M na-achọ ha aga n’ụlọ mmanya, n’ebe a na-eri oriri na nkwari n’abalị, nakwa na chọọchị. Mgbe ọ bụla ndị obodo anyị na-eme ememme, m na-eji ejiji ka nwaanyị ma na-agba egwú. Abụ m onye a ma ama.
Ụfọdụ ndị enyi m bụ ndị nwoke na-edina ndị nwoke, ndị akwụna, na ndị ọgwụ ọjọọ riri ahụ́. Ụfọdụ n’ime ha mere ka m ṅụọ koken, tupu mụ amara ihe na-emenụ, ịṅụ koken eriela m ahụ́. Mgbe ụfọdụ, anyị na-aṅụgide koken chi abọọ. E nwekwara oge ndị m na-anọ naanị m, si n’ụtụtụ ṅụgide koken chi ejie. M bịara taa ezigbo ahụ́ nke mere
ka ndị mmadụ na-ekwu ebe niile na m bu ọrịa o biri n’ájá ọcha.OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M: Ọ bụ oge ihe a na-eme ka m hụrụ Ndịàmà Jehova. Ha nyeere m ezigbo aka. Otu n’ime amaokwu Baịbụl ndị ha gụụrụ m bụ Ndị Rom 10:13. Ebe ahụ sịrị: “Onye ọ bụla nke na-akpọku aha Jehova ka a ga-azọpụta.” Amaokwu Baịbụl a mere ka m ghọta na m kwesịrị ịkpọ aha Jehova. Ọtụtụ mgbe, m na-aṅụgide koken n’abalị chi abọọ. Mgbe chi bọrọ, ana m emeghe windo ụlọ m, lewe anya n’eluigwe, ma jiri anya mmiri kpegara Jehova ekpere ka o nyere m aka.
M kpebiri ịkwụsị ịṅụ koken n’ihi na m na-eche banyere mama m obi na-agbawa ka ọ na-ahụ ka m ji ọgwụ ọjọọ na-achọ igbu onwe m. Ọ dịghị anya mụ ekweta ka mụ na Ndịàmà Jehova mụwa Baịbụl. Ha mere ka obi sie m ike na Baịbụl mụ na ha na-amụ ga-eme ka m kpebisikwuo ike ịkwụsị ịṅụ ọgwụ ọjọọ. O mekwara ka m kwụsị ịṅụ ya otú ahụ ha kwuru!
Ka m na-amụ Baịbụl, aghọtara m na m kwesịrị ịgbanwe otú m si ebi ndụ. Ihe kacha siere m ike ịkwụsị bụ idina ụmụ nwoke ibe m, n’ihi na o riela m ahụ́. Ma ihe nyeere m aka bụ na akwụsịrị m ime ihe ndị ahụ na-eme ka m na-eme omume rụrụ arụ. Mụ na ndị enyi ọjọọ kwụsịrị ịkpa, akwụsịkwara m ịga ebe a na-aṅụ mmanya na ebe a na-eri oriri na nkwari n’abalị.
Ọ bụ eziokwu na ịkwụsị ihe ndị a adịghịrị m mfe, ihe nyeere m aka bụ na m mụtara na Jehova na-eche banyere m nakwa na ọ ghọtara ihe mụ na ya na-alụ. (1 Jọn 3:19, 20) N’afọ 2002, akwụsịrị m iso ụmụ nwoke ibe m na-enwe mmekọahụ. Ọ bụkwa n’afọ ahụ ka e mere m baptizim, mụ aghọọ Onyeàmà Jehova.
URU NDỊ M RITERELA: Obi tọrọ mama m ezigbo ụtọ n’ihi otú m si kwụsị ihe ọjọọ ndị ahụ m na-eme, nke ahụ mere ka ya na Ndịàmà Jehova mụwakwa Baịbụl. Ma ọ dị mwute na ọ na-arịa ọrịa strok kemgbe. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ ka hụrụ Jehova n’anya, ọ naghịkwa eji eziokwu dị na Baịbụl egwu egwu.
Kemgbe afọ asatọ, m na-ekwusa ozi ọma oge niile. M na-ejikarị oge m akụziri ndị ọzọ Baịbụl. N’eziokwu, o nwere mgbe ime ihe ọjọọ na-agụ m agụụ, ma m na-ejisi ike wepụ ya n’obi m. Ma ihe na-enyere m aka ịghara ime ihe ndị ahụ bụ na m ma na obi ga-atọ Jehova ụtọ ma ọ bụrụ na mụ emeghị ha.
Ịbịaru Jehova nso na ime ihe dị ya mma emeela ka ndị mmadụ na-akwanyekwuru m ùgwù. Taa, enwere m obi ụtọ.
“Abụbu m udu mmanya na-anaghị eju eju”—LUKA ŠUC
A MỤRỤ M N’AFỌ: 1975
ABỤ M ONYE: SLOVINIA
NDỤ M BIRI: ABỤ M ONYE AṄỤRỤMA
NDỤ M BIRI NA MBỤ: A mụrụ m n’obodo Lublịana, bụ́ isi obodo Slovinia. Mgbe m bụ nwata, ndị mụrụ m na-enye m ihe ọ bụla m chọrọ. Ma mgbe m dị afọ anọ, ihe gbanwere. Papa m gburu onwe ya. Mgbe papa m gbuchara onwe ya, mama m malitere ịrụsi ọrụ ike ka o nwee ike ịkpata ihe mụ na nwanne m nke tọrọ m ga-eri.
Mgbe m dị afọ iri na ise, m gara ka mụ na nne nne m
biri. Obi dị m ụtọ na mụ na ya bi n’ihi na ọtụtụ ndị enyi m bi ebe ahụ. M na-emekwa ihe ọ bụla masịrị m ugbu a karịa mgbe ahụ m nọ n’ụlọ anyị. Mgbe m dị afọ iri na isii, mụ na ndị na-aga aṅụ mmanya ná ngwụcha izu malitere ịkpa. M hapụrụ isi m ya etoo ogologo, malitekwa iji ejiji ka ndị agboro, mechaakwa ṅụwa sịga.N’agbanyeghị na m ṅụtụrụ ọgwụ ọjọọ dị iche iche ma mechaa kwụsị ha, akwụsịghị m ịṅụ mmanya n’ihi na ọ bụ ya kacha atọ m ụtọ. Ọ dịghị anya mụ esi n’ịṅụ iko mmanya ole na ole ṅụwazie ọtụtụ karama mmanya otu mgbe. M ṅụbiga mmanya ókè, ama m otú e si eme ka ndị mmadụ ghara ịmata na mmanya na-egbu m. Ọ na-abụkarị naanị ísì mmanya m ṅụrụ ka ndị mmadụ na-eji ama na m ṅụrụ mmanya. O nweghịdị onye na-ama na aṅụọla m ọtụtụ karama biya a gwakọtara ya na mmanya ọkụ!
Ọ bụdị m na-akpọkarị ndị enyi m ala mgbe anyị ṅụchara mmanya n’ebe anyị gara ịgba egwú disko n’abalị, ọ bụ eziokwu na mmanya m na-aṅụ na-aka nke ha ṅụrụ okpukpu abụọ. Otu ụbọchị, anụrụ m ebe otu enyi m na-ekwu na m bụ udu mmanya na-anaghị eju eju. Ihe a ọ kpọrọ m bụ okwu mkparị. Ọ bụ ya ka a na-akpọ onye aṅụrụma n’obodo Slovinia. Ihe a ọ kpọrọ m wutere m nke ukwuu.
Ihe ahụ o kwuru mere ka m malite ichebara ndụ m echiche. Ike ụwa bịara gwụ m, ya adịzie m ka abaghị m uru.
OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M: Ọ bụ mgbe ahụ ka m chọpụtara na otu nwa klas anyị agbanweela. Ọ naghịzi eme ike ike. M kpọọrọ ya gaa ebe a na-ere nri ka m jụọ ya ihe mere o ji gbanwee. Mgbe mụ na ya na-akparịta, ọ gwara m na ya na Ndịàmà Jehova amụwala Baịbụl. Ọ kọọrọ m ụfọdụ ihe ndị ọ mụtara. Ihe ndị ahụ ọ kọọrọ m juru m anya n’ihi na o nwetụbeghị onye kụziiri m gbasara Chineke kemgbe a mụrụ m. Amalitere m ịga ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova, mụ na ha ana-amụkwa Baịbụl.
Baịbụl mụ na ha na-amụ mere ka m ghọta ọtụtụ ihe ndị m na-amabughị, ihe ndị ahụ m mụtara metụkwara m n’obi. Dị ka ihe atụ, m mụtara na Baịbụl kpọrọ oge a anyị bi na ya ‘oge ikpeazụ.’ (2 Timoti 3:1-5) Amụtakwara m na Chineke ga-ebibi ndị ọjọọ n’oge na-adịghị anya ma mee ka ndị ezi omume biri na Paradaịs ruo mgbe ebighị ebi. (Abụ Ọma 37:29) Ekpebisiziri m ike ịgbanwe ndụ ọjọọ m na-ebi ka m nwee ike iso ná ndị ezi omume ahụ.
M malitere ịgwa ndị enyi m ihe ndị m na-amụta na Baịbụl. Ọtụtụ n’ime ha chịrị m ọchị mgbe m na-agwa ha ihe ndị ahụ. Ma ihe a ha mere baara m uru. O mere ka m ghọta na ha abụghị ezigbo ndị enyi. M bịara ghọta na ọ bụ ndị enyi ọjọọ ahụ mụ na ha na-akpa mere ka m na-aṅụ oké mmanya. Ọ na-adịkarị ha ka izu gwụwa agwụwa ka ha gaa ṅụraa anya otú ha si aṅụ.
Mụ na ndị enyi ọjọọ ahụ kwụsịrị ịkpa, mụ na Ndịàmà Jehova kpawara n’ihi na ha na-agba m ume ka m mee ihe ziri ezi. Ndịàmà Jehova ji obi ha niile na-efe Chineke n’ihi na ha hụrụ ya n’anya, ha na-agbakwa mbọ ibi ndụ otú Chineke si chọọ. M ji nwayọọ nwayọọ kwụsị ịṅụ oké mmanya.
URU NDỊ M RITERELA: M na-ekele Jehova na ọ bụghịzi ịṅụ oké mmanya na-eme ka obi na-atọ m ụtọ. Amaghịdị m ihe gaara eme m ma a sị na m ka na-ebi ndụ ọjọọ. Ma, o doro m anya na ndụ m ka mma ugbu a.
Obi dị m ụtọ na ejeela m ozi n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova nke dị na Slovinia afọ asaa ugbu a. M jizi ndụ m eme ihe bara uru n’ihi na amatala m Jehova ma na-ejere ya ozi.