Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ì Kwesịrị Ikwere na Ọrụ Ebube Ndị A Kọrọ na Baịbụl Mere Eme?

Ì Kwesịrị Ikwere na Ọrụ Ebube Ndị A Kọrọ na Baịbụl Mere Eme?

Ì Kwesịrị Ikwere na Ọrụ Ebube Ndị A Kọrọ na Baịbụl Mere Eme?

Ọ BỤRỤ na mmadụ akọọrọ gị akụkọ tụrụ gị n’anya, ị̀ ga-asị ozugbo na ihe ọ kọrọ abụghị eziokwu, ka ị̀ ga-ebugodị ụzọ jụọ onwe gị ma onye ahụ ọ̀ bụ onye na-ekwu eziokwu ka ọ̀ bụ onye ụgha? Ihe ọzọ ị ga-echebara echiche bụ otú o si kọọrọ gị akụkọ ahụ. Ọ bụrụ na ọ ghatụbeere gị ụgha kemgbe ị maara ya, o nweghị ihe ga-eme ka i chewe na ihe ahụ ọ kọọrọ gị ugbu a abụghị eziokwu.

Otú ahụ ka ọ dịkwa ọrụ ebube ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl. O nweghị onye n’ime anyị nọ ndụ mgbe ha mere. Ma anyị nwere ike ịchọpụta ma ihe ndị ahụ a kọrọ na Baịbụl hà bụ eziokwu. Olee otú anyị ga-esi achọpụta? Ka anyị hụ ihe ụfọdụ gosiri na ọrụ ebube ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl bụ eziokwu.

A rụrụ ọtụtụ ọrụ ebube ndị ahụ n’ihu ndị mmadụ. Ọtụtụ puku mmadụ ma ọ bụ ọtụtụ nde mmadụ hụrụ mgbe a rụrụ ụfọdụ ọrụ ebube ndị ahụ. (Ọpụpụ 14:21-31; 19:16-19) A rụghị ha na nzuzo, n’ebe ndị mmadụ na-agaghị ahụ ha.

A rụghị ọrụ ebube ndị ahụ otú ga-agbagwoju ndị mmadụ anya. Mgbe a rụrụ ọrụ ebube ndị ahụ, e bughị ụzọ mee nkwadebe pụrụ iche ma ọ bụ weta ihe ụfọdụ ga-adọta mmasị ndị mmadụ ma ọ bụkwanụ gbanye ọkụ ga-emegharị ndị mmadụ anya tupu a rụọ ha. Ọtụtụ ọrụ ebube ndị ahụ mere mgbe ọ na-enweghị onye ma na a ga-eme ha ma ọ bụ ozugbo mmadụ rịọrọ ka e nyere ya aka. (Mak 5:25-29; Luk 7:11-16) N’ihi ya, o nweghị onye ga-asị na a gwara ndị mmadụ ka ha gbakọọ ka a rụọrọ ha ọrụ ebube.

Ndị rụrụ ọrụ ebube ndị ahụ arụghị ha ka ha ghọọ ndị a ma ama ma ọ bụ ka e too ha ma ọ bụ ka ha jiri ya kpaa ego. Kama ha rụrụ ya iji nye Chineke otuto. (Jọn 11:1-4, 15, 40) A katọrọ onye ọ bụla chọrọ iji ọrụ ebube kpaa ego.—2 Ndị Eze 5:15, 16, 20, 25-27; Ọrụ Ndịozi 8:18-23.

Ọrụ ebube ndị a kọrọ na Baịbụl dị n’ụdị n’ụdị. Nke a gosiri na ha esighị n’aka mmadụ. Dị ka ihe atụ, e mere ka osimiri daa jụụ mgbe e nwere ebili mmiri, mee ka mmiri ghọọ mmanya, mee ka mmiri kwụsị izo, meekwa ka o zoo. A gwọkwara ndị ọrịa, megheekwa anya ndị ìsì. Ọrụ ebube niile a na ọtụtụ ọrụ ebube ndị ọzọ gosiri na ọ bụ onye ike ya karịrị nke mmadụ rụrụ ha.—1 Ndị Eze 17:1-7; 18:41-45; Matiu 8:24-27; Luk 17:11-19; Jọn 2:1-11; 9:1-7.

Ndị iro Jizọs, bụ́ ndị hụrụ ọrụ ebube ndị Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya rụrụ, ekwughị na ha emeghị eme. Mgbe Jizọs kpọlitere enyi ya Lazarọs n’ọnwụ, o nweghị mgbe ndị iro Jizọs kwuru na a kpọliteghị Lazarọs n’ọnwụ. O nweghị otú ha ga-esi ekwu otú ahụ n’ihi na Lazarọs nọrọ abalị anọ n’ili tupu Jizọs akpọlite ya. (Jọn 11:45-48; 12:9-11) Ndị dere akwụkwọ okpukpe ndị Juu a na-akpọ Talmud dere n’akwụkwọ ahụ na Jizọs rụrụ ọtụtụ ọrụ ebube n’agbanyeghị na mgbe ha dere akwụkwọ ahụ na o ruola ọtụtụ narị afọ Jizọs nwụrụ. Ihe ndị iro Jizọs ahụ na-ekwetaghị bụ na ọ bụ Chineke nyere ya ike o ji rụọ ọrụ ebube. Mgbe a kpọgakwara ndị na-eso ụzọ Jizọs n’ụlọikpe ndị Juu, ajụjụ a jụrụ ha abụghị, “Ọ̀ bụ eziokwu na unu rụrụ ọrụ ebube?” Kama ihe a jụrụ ha bụ: “Olee ike unu ji mee ihe a, ọ̀ bụkwa aha onye ka unu ji mee ya?”—Ọrụ Ndịozi 4:1-13.

Ajụjụ bụzi, ì kwesịrị ikwere na ọrụ ebube ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl bụ eziokwu? Ihe ndị a anyị lebara anya na ha gosiri na ọrụ ebube ndị ahụ mere eme. E nwekwara ihe ndị ọzọ mere anyị ga-eji kweta na ihe ndị ahụ a kọrọ na Baịbụl bụ eziokwu. Dị ka ihe atụ, Baịbụl na-ekwukarị oge akụkọ ndị a kọrọ na ya mere, ebe ha mere, na aha ndị a kọrọ akụkọ ha. Ọ na-ejudị ndị na-ekweghị na Baịbụl anya mgbe ha chọpụtara na akụkọ dị iche iche a kọrọ na Baịbụl mere otú ahụ e si kọọ ha. Ọtụtụ amụma ndị e buru na Baịbụl emezuokwala otú e buru ha n’amụma. Ihe ọzọkwa bụ na Baịbụl kwuru ọtụtụ ihe ga-eme ka mmadụ na ibe ya na-adị ná mma. Ihe ndị ahụ enyekwarala ma onye ukwu ma onye nta aka. E nweghị ebe ọzọ mmadụ ga-enweta ndụmọdụ ga-eme ka ya na ndị ọzọ dịrị ná mma karịa ndị nke dị na Baịbụl.

Ọ bụrụ na i kwetachabeghị na ihe ndị e kwuru na Baịbụl bụ eziokwu, gbalịsie ike ka i wepụta oge na-amụ Baịbụl. Ọ bụrụ na ị malite ịmụ Baịbụl, ị ga-amalite ikwere na ihe ndị e kwuru na ya bụ eziokwu. (Jọn 17:17) Ọ bụ mgbe ahụ ka ị ga-aghọta na ọrụ ebube ndị a kọrọ na ya mere eme n’eziokwu. Ozugbo i kwetara na ha mere eme, ọ gaghị esiri gị ike ikweta na ihe ndị Baịbụl kwuru na ha ga-eme n’ọdịnihu ga-emekwa eme.

[Foto dị na peeji nke 7]

O nweghị mgbe ndị iro Jizọs kwuru na a kpọliteghị Lazarọs n’ọnwụ