Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọrụ Ebube Ndị Chineke Ga-arụ n’Oge Na-adịghị Anya

Ọrụ Ebube Ndị Chineke Ga-arụ n’Oge Na-adịghị Anya

Ọrụ Ebube Ndị Chineke Ga-arụ n’Oge Na-adịghị Anya

Ọ BỤRỤ na mmadụ gara ụlọ ọgwụ ka a waa ya ahụ́, ya achọpụta na dọkịta ga-awa ya ahụ́ ahụ awatụbeghị mmadụ ahụ́, olee otú i chere obi ga-adị onye ahụ? O doro anya na obi agaghị eru ya ala. Ma ọ bụrụkwanụ na onye ahụ achọpụta na dọkịta ahụ bụ ọkachamara n’ịwa ahụ́ nakwa na ọ waala ọtụtụ ndị ahụ́ ha agbakee? Obi ọ́ gaghị esi ya ike na ọ ga-agbakekwa ma dọkịta ahụ waa ya ahụ́?

Ụwa anyị a yiri onye na-arịa ọrịa. Ọ bụ Jehova Chineke bụ dọkịta ahụ nke ga-agwọ ụwa a ọrịa ya. Chineke kwere anyị nkwa n’Okwu ya, bụ́ Baịbụl, na ọ ga-eme ka ụwa a ghọọ paradaịs otú ọ dịbu. (2 Pita 3:13) Ma tupu Chineke emee ka ụwa ghọọ paradaịs, ọ ga-ebu ụzọ bibie ndị ajọ omume. (Abụ Ọma 37:9-11; Ilu 2:21, 22) Nsogbu niile juru n’ụwa ga-akwụsịrịrị tupu ụwa aghọọ paradaịs. Ọ bụ ọrụ ebube Chineke ga-arụ ga-eme ka nke a nwee isi!—Mkpughe 21:4, 5.

Ndịàmà Jehova kweere na ihe ọma niile a ga-eme n’oge na-adịghị anya. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ọrụ ebube ndị Jehova Chineke rụrụla gosiri na ọ ga-emezuli nkwa niile o kwere. Ka anyị lebagodị anya n’ọrụ ebube isii ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl ma hụ ihe ha na-akụziri anyị banyere nkwa ndị Chineke kwere bụ́ ndị ga-emezu n’ọdịnihu.

Ọ ga-adị mma ka ị nọgide na-amụ banyere nkwa ndị Chineke kwere na Baịbụl, bụ́ ndị ga-emezu n’ọdịnihu. I mee otú ahụ, okwukwe gị ga-esi ike. Ọ bụrụ na okwukwe gị esie ike, ọ ga-abịazi doo gị anya na ị ga-eso ná ndị ọrụ ebube ndị ahụ Jehova ga-arụ ga-abara uru.

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 9]

ỌRỤ EBUBE A KỌRỌ NA BAỊBỤL:

JIZỌS JI ACHỊCHA NA AZỤ̀ OLE NA OLE NYEJUO ỌTỤTỤ PUKU MMADỤ AFỌ.​—MATIU 14:13-21; MAK 8:1-9; JỌN 6:1-14.

NKWA CHINEKE KWERE:

“Ala ga-emepụta ihe nke ọma; Chineke bụ́ Chineke anyị ga-agọzi anyị.”ABỤ ỌMA 67:6.

IHE NKE A NA-AKỤZIRI ANYỊ:

O NWEKWAGHỊ ONYE GA-ANỌ AGỤỤ.

ỌRỤ EBUBE A KỌRỌ NA BAỊBỤL:

JIZỌS MEGHERE ANYA NDỊ ÌSÌ.​—MATIU 9:27-31; MAK 8:22-26.

NKWA CHINEKE KWERE:

“A ga-emeghe anya ndị ìsì.”​AỊZAYA 35:5.

IHE NKE A NA-AKỤZIRI ANYỊ:

NDỊ ÌSÌ NIILE GA-AMALITE ỊHỤ ỤZỌ.

ỌRỤ EBUBE A KỌRỌ NA BAỊBỤL:

JIZỌS GWỌRỌ NDỊ NWERE NKWARỤ.​—MATIU 11:5, 6; JỌN 5:3-9.

NKWA CHINEKE KWERE:

“Onye ngwọrọ ga-awụli elu dị ka oké ele.”​AỊZAYA 35:6.

IHE NKE A NA-AKỤZIRI ANYỊ:

A GA-AGWỌ NDỊ MMADỤ ỤDỊ NKWARỤ Ọ BỤLA HA NWERE.

ỌRỤ EBUBE A KỌRỌ NA BAỊBỤL:

JIZỌS GWỌRỌ ỤDỊ ỌRỊA DỊ ICHE ICHE.​—MAK 1:32-34; LUK 4:40.

NKWA CHINEKE KWERE:

“Ọ dịghị onye bi na ya nke ga-asị: ‘Ana m arịa ọrịa.’”AỊZAYA 33:24.

IHE NKE A NA-AKỤZIRI ANYỊ:

A GA-AGWỌ NDỊ MMADỤ ỤDỊ ỌRỊA Ọ BỤLA HA NA-ARỊA. AHỤ́ GA-ESI MMADỤ NIILE IKE.

ỌRỤ EBUBE A KỌRỌ NA BAỊBỤL:

JIZỌS MERE KA OSIMIRI DAJỤỌ, MEEKWA KA OKÉ IFUFE KWỤSỊ.​—MATIU 8:23-27; LUK 8:22-25.

NKWA CHINEKE KWERE:

“Ha ga-ewu ụlọ, biri n’ime ha; ha ga-akọkwa ubi vaịn, rie mkpụrụ ha. Ha agaghị adọgbu onwe ha n’ọrụ n’efu.”​AỊZAYA 65:21, 23.

“Ị ga-anọkwa ihe ọ bụla na-emenye ụjọ n’ebe dị anya, n’ihi na ọ gaghị erute gị nso.”​AỊZAYA 54:14.

IHE NKE A NA-AKỤZIRI ANYỊ:

A GAGHỊ ENWEKWA ỌDACHI NDỊ NA-EMERE ONWE HA.

ỌRỤ EBUBE A KỌRỌ NA BAỊBỤL:

JIZỌS KPỌLITERE NDỊ NWỤRỤ ANWỤ N’ỌNWỤ.​—MATIU 9:18-26; LUK 7:11-17.

NKWA CHINEKE KWERE:

“Ndị niile nọ n’ili ncheta ga-anụ olu ya wee pụta.”JỌN 5:28, 29.

“Oké osimiri hapụkwara ndị nwụrụ anwụ nọ n’ime ya, ọnwụ na Hedis hapụkwara ndị nwụrụ anwụ nọ n’ime ha.”MKPUGHE 20:13.

IHE NKE A NA-AKỤZIRI ANYỊ:

A GA-AKPỌLITE NDỊ ANYỊ HỤRỤ N’ANYA NWỤRỤ ANWỤ N’ỌNWỤ.