Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ
Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ
GỊNỊ mere otu ọkàikpe a ma ama, onye ndị ezinụlọ ya bụ ezigbo ndị Katọlik, ji ghọọ Onyeàmà Jehova? Gịnị mere otu nwoke nke na-eyi ọha egwu ji kwụsị arụ ọ na-akpa ma ghọọ onye na-ekwusa ozi ọma? Gụọ ihe ha kwuru.
“Abịara m ghọtakwuo ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ.”—SEBASTIÃO ALVES JUNQUEIRA
A MỤRỤ M N’AFỌ: 1946
ABỤ M ONYE: BRAZIL
NDỤ M BIRI: ABỤ M EZIGBO ONYE KATỌLIK
NDỤ M BIRI NA MBỤ: Ezinụlọ anyị biri n’otu obodo na-emepeghị emepe nke dị ihe dị ka kilomita isii ma e si n’obodo Piketi gawa ya. Papa m na mama m na-akọ ugbo n’ebe ahụ anyị bi, ihe anyị na-enweta n’ala ahụ na-ezukwara anyị. Ọ bụ n’obodo Piketi ka m na-aga akwụkwọ. N’ihi ya, m mechara zụọ ígwè ochie ma jiri ya na-aga akwụkwọ. Ọtụtụ ndị bi n’obodo ahụ anyị bi bụ ndị ogbenye. Ma obodo ahụ na-adị ọcha, ọ na-esitụkwa ike tupu mmadụ anụ na ndị ọjọọ kpara arụ na ya. Ọtụtụ ụmụ nwoke ndị bi n’obodo ahụ na-arụ ọrụ n’ụlọ ọrụ na-akpụpụtara ndị agha ngwá agha.
Ejighị m ịgụ akwụkwọ egwuri egwu. N’ihi ya, m gbara mbọ banye otu ụlọ akwụkwọ ndị agha nke na-akụzi otú e si arụ ụgbọelu. Ụlọ akwụkwọ a dị n’otu nnukwu obodo nke dị nso n’ebe anyị bi. Mgbe m gụchara akwụkwọ n’afọ 1966, e bugoro m n’ọkwá sajenti. M banyeziri n’ụlọ akwụkwọ ndị ọkàiwu bụ́ ebe m nọ nweta akara ugo mmụta ndị ọkàiwu. Mgbe obere oge gafere, m tinyere akwụkwọ ka e wee m n’ọrụ ka m bụrụ onyeisi ndị uwe ojii. N’afọ 1976, m mere nke ọma n’ule e lere m maka ọrụ a, e mechakwara nye m ọrụ ahụ. Mgbe ụfọdụ, ilekọta ụlọ mkpọrọ na-eso n’ọrụ m. N’oge ndị ahụ, Ndịàmà Jehova na-abịakarị anata m ikike ka ha kwusaa ozi ọma n’ụlọ mkpọrọ. Ha na-ezikwa m ozi ọma mgbe ọ bụla ha bịara. Anaghị m eji ihe ọ bụla gbasara Chineke egwuri egwu. Obi tọrọ m ụtọ mgbe m matara na aha Chineke bụ Jehova nakwa na anyị na ya nwere ike ịbụ enyi.
M ji nwayọọ nwayọọ na-agbalị ka m ghọọ ọkàikpe. N’afọ 1981, m mere nke ọma n’ule ọzọ e lere m. N’ihi ya, e mere m ọkàikpe. N’afọ 2005, aghọrọ m ọkàikpe nke na-ekpe ikpe n’ụlọikpe mkpegharị ikpe nke dị na Saụ Paụlo.
OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M: Ozugbo m gụchara akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ ndị ọkàiwu, amalitere m ịgụ Baịbụl. Baịbụl ahụ m na-agụ mere ka m gbanwee otú m si eche echiche. Abụ m ezigbo onye Katọlik. E nwere otu bishọp n’ezinụlọ anyị, nweekwa ndị ụkọchukwu, m na-enyekwara ụkọchukwu aka mgbe a na-edo mas na chọọchị anyị. Tupu ụkọchukwu ekwuo okwuchukwu, m na-agụpụta ebe a gwara m ka m gụpụta n’akwụkwọ ekpere ndị Katọlik. Ndị Katọlik anachaghị agụ Baịbụl n’ezinụlọ ha. N’ihi ya, ezigbo iwe were mama m mgbe ọ nụrụ na m na-agụ Baịbụl. Ọ gbalịrị ime ka m kwụsị ịgụ Baịbụl. Ọ sịrị na ọ bụrụ na
akwụsịghị m ịgụ ya, na isi ga-agbaka m. N’agbanyeghị ihe ahụ o kwuru, akwụsịghị m ịgụ Baịbụl maka na o nweghị ihe m hụrụ dị njọ n’ịgụ ya.Echere m na ihe mere m ji na-agụ Baịbụl bụ na e nwere ọtụtụ ihe m chọrọ ịmata. M chọrọ ịmatakwu banyere ndị ụkọchukwu na ọrụ ha na-arụ na chọọchị. M malitekwara ịgụ akwụkwọ kọrọ ihe ndị Katọlik ụfọdụ chọrọ ka chọọchị Katọlik mewe. Ha chọrọ ka chọọchị Katọlik nye aka kwụsị mmegbu a na-emegbu ndị mmadụ ná mba dị iche iche na ahụhụ ndị mmadụ na-ata n’ihi ụkọ ego na ọchịchị nchịgbu. Ma ihe ndị e kwuru n’akwụkwọ ahụ enweghị isi.
N’oge ahụ, e nwere otu akwụkwọ m nwetara. Onye nyere m akwụkwọ ahụ bụ dọkịta ezé nke m na-agakwuru ma ezé nyewe m nsogbu. Dọkịta ahụ na-ekpe okpukpe Buda. Isiokwu akwụkwọ ahụ o nyere m bụ Did Man Get Here by Evolution or by Creation? * [È Kere Mmadụ Eke Ka Ọ̀ Pụtara n’Onwe Ya] Ihe mere m ji nara ya akwụkwọ ahụ bụ na m chere na ọ ga-atọ m ụtọ ma m gụkọta ya na otu akwụkwọ Charles Darwin dere. Charles Darwin kụziri n’akwụkwọ ahụ na e keghị mmadụ eke. Ihe e dere n’akwụkwọ ahụ bụ́ Did Man Get Here by Evolution or by Creation? doro anya, a naghịkwa agbagha ya agbagha. Ọ bịara doo m anya na ihe ahụ ndị mmadụ na-akụzi, nke bụ́ na e keghị mmadụ eke, bụ okpookpo ụgha.
Akwụkwọ Ndịàmà Jehova ahụ m gụrụ mere ka m chọọ ịmatakwu ihe ndị ọzọ. M chọwara otú m ga-esi enweta akwụkwọ ndị ọzọ ha dere. Ndị mmadụ gwaziri m na otu nwoke nke na-arụzi injin n’ụlọ akwụkwọ ahụ nke na-akụzi otú e si arụ ụgbọelu bụ Onyeàmà Jehova. M gakwuuru ya, mụ na ya ekwurịta okwu, ya enyezie m ụfọdụ akwụkwọ Ndịàmà Jehova ka m gụọ. N’oge ahụ, ekweghị m ka Onyeàmà Jehova ọ bụla bịa na-akụziri m Baịbụl. Echere m na m nwere ike ịmụ Baịbụl n’onwe m.
Mgbe m malitere ịgụ Baịbụl, echere m na ebe ọ bụ na m lụọla nwaanyị, na ọ ga-adị mma ka mụ na nwunye m na ụmụ anyị na-agụkọ ya ọnụ. Kwa izu, anyị niile na-ezukọta mụọ ihe ma gụọ Baịbụl. Ebe ọ bụ na anyị bụ ndị Katọlik, o nweghị ihe anyị na-eme n’ezinụlọ anyị n’ebughị ụzọ kpọtụrụ ndị ụkọchukwu na ndị bishọp. N’ihi ya, ihe m gụtara na Jọn 14:6 metụrụ m n’ahụ́. Ebe ahụ kwuru, sị: “Jizọs wee sị [Tọmọs onye na-eso ụzọ ya]: ‘Ọ bụ m bụ ụzọ na eziokwu na ndụ. Ọ dịghị onye na-abịakwute Nna m ma ọ́ bụghị site na mụ.’” Mgbe m nyochara amaokwu ahụ nke ọma, ọ bịara doo m anya na ọ bụ Jizọs ka Jehova ga-esi n’aka ya zọpụta anyị. Ma ihe a kụziiri anyị na chọọchị bụ na a ga-esi n’aka ndị ụkọchukwu zọpụta anyị.
O nwere ebe abụọ ọzọ m gụrụ na Baịbụl nke mere ka otú m si ele Chọọchị Katọlik anya na ihe ha na-akụzi gbanwee. Otu n’ime ha bụ Ilu 1:7, bụ́ ebe kwuru, sị: “Ịtụ egwu Jehova bụ mmalite ihe ọmụma. Ọ bụ amamihe na ịdọ aka ná ntị ka ndị nzuzu leghaara anya.” Nke ọzọ abụrụ Jems 1:5, bụ́ ebe kwuru, sị: “Ọ bụrụ na e nwere onye ọ bụla n’ime unu amamihe kọrọ, ka ọ na-arịọ Chineke, n’ihi na ọ na-eji mmesapụ aka enye mmadụ niile ihe, n’akọchaghịkwa ha; ọ ga-enye onye ahụ amamihe.” Ọ na-agụsi m agụụ ike inweta amamihe na ịmụta ọtụtụ ihe, ma chọọchị ahụ enyereghị m aka ime otú ahụ. N’ihi ya, m kwụsịrị ịga ya.
N’afọ 1980, nwunye m na Ndịàmà Jehova malitere ịmụ Baịbụl. Mgbe ọ bụla m nọ n’ụlọ, m na-eso ha amụ Baịbụl. M mechakwara kweta ka mụ na ha mụwa Baịbụl. Ma, o were anyị ogologo oge tupu anyị ekweta na anyị ga-abụ Ndịàmà Jehova. E mechara mee nwunye m baptizim n’afọ 1994, e meekwa m n’afọ 1998.
URU NDỊ M RITERELA: Ihe ndị anyị ji Baịbụl kụziere ụmụ anyị abaarala ha uru n’ihi na ha na-ebi ndụ otú Jehova chọrọ. (Ndị Efesọs 6:4) Ụmụ anyị dị anọ. Abụọ bụ nwoke, abụọ abụrụ nwaanyị. Ndị nke nwoke na-enyere Ndịàmà Jehova ibe ha, bụ́ ndị ha na ha nọ n’ọgbakọ, aka ka ha nọgide na-efe Chineke. Ndị nke nwaanyị ji obi ha niile na-ekwusara ndị mmadụ ozi ọma. N’ọnwa ọ bụla, nwunye m na-ewepụta ọtụtụ awa kụziere ndị mmadụ Baịbụl. Mụnwa bụ okenye n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova.
Mgbe m ghọrọ Onyeàmà Jehova, abịara m ghọtakwuo
ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ. Mgbe ọ bụla m na-ekpe ikpe, ana m agbalị imeso onye ọ bụla ihe otú Jehova si eme ihe. Dị ka ihe atụ, ana m agbalị ka m ghọta otú ihe niile si mee tupu mụ ekpebie ikpe ọ bụla, m na-emekwa ebere mgbe ọ bụla m kwesịrị ime ebere.Ekpeela m ọtụtụ ndị mere ihe ọjọọ ikpe, ma ndị metọrọ ụmụaka ma ndị kpara ụdị arụ ndị ọzọ. N’agbanyeghị nke ahụ, ihe ọjọọ ndị mmadụ na-eme ka na-egbu m mgbu n’obi. Mgbe ọ bụla m gbanyere tiivi ka m kirie ihe na-eme n’ụwa, omume rụrụ arụ na ihe ọjọọ niile ndị mmadụ na-eme na-agbawa m obi. Ana m ekele Jehova na o mere ka m ghọta ihe mere ihe ọjọọ ji ju n’ụwa, na-ekelekwa ya na o mere ka m mụta na ihe ga-adị mma n’ọdịnihu.
‘Mkpọrọ a tụrụ m emeghị ka m gbanwee.’—KEITH WOODS
A MỤRỤ M N’AFỌ: 1961
ABỤ M ONYE: NỌTAN AYALAND
NDỤ M BIRI: ABỤ M ONYE NA-EYI ỌHA EGWU
NDỤ M BIRI NA MBỤ: A mụrụ m n’afọ 1961 n’otu obodo a na-akpọ Pọtedọn, nke dị na Nọtan Ayaland. Ndị mụrụ m bụ ndị Protestant. N’oge m na-eto, anyị bi n’otu nnukwu esteet. Ọtụtụ ndị bikwa n’ebe ahụ, ma ndị Katọlik ma ndị Protestant. Imeriime ndị bi na ya bụ ndị ogbenye. N’agbanyeghị nke ahụ, anyị niile bi n’udo ma na-emekọ ihe ọnụ.
Otú m si bie ndụ n’oge m bụ okorobịa na-agba m anya mmiri. N’afọ 1974, m tinyere aka n’ọgba aghara e nwere ná mba anyị. Ọgba aghara ahụ bịara kawa njọ n’ebe ahụ anyị bi nakwa n’ebe ndị ọzọ. Dị ka ihe atụ, njinji jiri n’otu abalị mgbe papa m nọ n’ebe ọ na-arụ ọrụ na-akụziri ụmụ okorobịa abụọ bụ́ ndị Katọlik ọrụ. Ụmụ okorobịa ahụ bụ ndị agbata obi anyị, a gafee ụlọ anyị, e nweta nke ha. N’abalị ahụ, otu onye si na windo palọ ha tụba bọmbụ n’ụlọ ha, bọmbụ ahụ egbuo papa ha na mama ha na otu nwanne ha nwoke.
Nsogbu bịaziri ka njọ nke na ndị Protestant na ndị Katọlik malitere ịlụso ibe ha agha. Ndị Katọlik gbara ụlọ ndị Protestant dị n’ebe ọtụtụ ndị Katọlik bi ọkụ nke mere ka ndị Protestant si n’ebe ndị ahụ kwapụ. Ndị Protestant anaghịkwa eji anya ahụ ndị Katọlik bi n’ebe ndị Protestant bi. Ọgba aghara ahụ mere ka ndị Protestant jupụtazie n’ebe ahụ anyị bi. N’oge na-adịghị anya, a nwụchiri m ma tụọ m mkpọrọ afọ atọ maka na aka m dị na bọmbụ a tụrụ.
Mgbe m nọ n’ụlọ mkpọrọ, mụ na otu onye mkpọrọ ọzọ ghọrọ enyi. Onye mkpọrọ a bụkwa onye Protestant a ma ama nke aka ya dịkwa n’ọgba aghara ahụ. Mụ na ya na-eme ka ndị nne ji. Ọ bụ m kwụ ya n’azụ n’oge ọ gbara akwụkwọ. Mkpọrọ ahụ a tụrụ anyị emeghị ka m gbanwee, o meghịkwanụ ka enyi m gbanwee. Mgbe anyị si n’ụlọ mkpọrọ pụta, anyị malitekwara ịkpa ike karịadị otú anyị kpara na mbụ. Nke a mere ka a tụọ enyi m nwoke ahụ mkpọrọ ọzọ. Ọ bụ n’ebe ahụ ka a nọ gbuo ya.
Ndị mmadụ malitekwara ịchọ otú ha ga-esi egbu m. O nwedịrị mgbe e ji bọmbụ tụkasịa ụgbọala m. Ma ihe ndị ahụ ha mere mere ka
m kpebisikwuo ike na ihe ọ sọkwara ya mee, agaghị m esepụ aka n’ọgụ ahụ.N’oge ahụ, eso m mee otu ihe nkiri nke ụlọ ọrụ mgbasa ozi e nwere na Briten gosiri na tiivi. Ihe nkiri ahụ kọrọ banyere ọgba aghara ahụ a na-enwe ná mba anyị. Ma, ihe nkiri ahụ kpatakwuuru m nsogbu. Dị ka ihe atụ, otu abalị mgbe m lọtara n’ụlọ, m chọpụtara na nwunye m agbalaala. Obere oge e gosichara ihe ahụ na tiivi, ndị gọọmenti bịara kpọrọ nwa m nwoke. M ka na-echeta otu ihe m mere n’oge ahụ. M gara n’enyo lee onwe m anya ma kwuo, sị: “Chineke, ọ bụrụ na ị dị adị, nyere m aka.”
N’ụbọchị Satọdee n’izu ahụ, ahụrụ m otu onye m ma ama aha ya bụ Paul. Paul bụ Onyeàmà Jehova. N’oge ahụ mụ na ya hụrụ, o ziri m ozi ọma. Mgbe ụbọchị abụọ gafere, o ziteere m otu Ụlọ Nche. N’otu isiokwu dị n’Ụlọ Nche ahụ, e dere ihe Jizọs kwuru na Jọn 18:36. Jizọs kwuru n’ebe ahụ, sị: “Alaeze m abụghị nke ụwa a. A sị na alaeze m bụ nke ụwa a, ndị na-ejere m ozi gaara alụ ọgụ ka a ghara inyefe m n’aka ndị Juu. Otú ọ dị, alaeze m esighị n’ebe a.” Ihe a Jizọs kwuru ruru m n’obi. Ọ bụ n’ụbọchị ahụ ka ndụ m malitere ịgbanwe.
OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M: Paul malitere ịkụziri m Baịbụl. E mechazie Onyeàmà Jehova ọzọ aha ya bụ Bill akụziwere m Baịbụl. Ma m na-enye onye ahụ na-akụziri m Baịbụl nsogbu. Nsogbu m na-enye ya bụ na m na-ajụ ya ọtụtụ ajụjụ. M na-akpọtakwa ọtụtụ ndị pastọ n’ụlọ m ka ha nọrọ mgbe Bill bịara ịkụziri m Baịbụl. Ihe mere m ji akpọta ha bụ ka ha gosi Bill na ihe ọ na-akụziri m abụghị eziokwu. N’agbanyeghị ihe niile ahụ m mere, achọpụtara m na ihe Bill na-akụziri m na Baịbụl bụ eziokwu.
Echetara m ihe mere otu ụbọchị mgbe m gwara Bill ka ọ ghara ịbịa n’ụlọ m ịkụziri m Baịbụl maka na e ji ihe tụchichaa ụzọ ndị e si abata n’ebe ahụ anyị bi. M gwakwara ya na ọ bụrụ na o buru ụgbọala ya bịa, a ga-agba ya ọkụ. N’agbanyeghị ihe ahụ m gwara Bill, ọ bịara. Kama ọ hapụrụ ụgbọala ya jiri ígwè ya bịa maka na o nweghị onye ga-achọ iburu ígwè ya. N’oge ọzọ, mgbe Bill nọ na-akụziri m Baịbụl n’ụlọ m, ndị uwe ojii na ndị agha bịara ka ha kpụrụ m. Ka ha kpụ m na-apụ, Bill gwara m n’olu dara ụda ka m tụkwasị Jehova obi. Ihe niile a merenụ kụziiri m nnukwu ihe.
N’oge mbụ m gara ọmụmụ ihe n’Ụlọ Nzukọ Ndịàmà Jehova, m kwụ ọla ntị, ntutu m tokwara ogologo ka nke ụmụ nwaanyị, eyikwa m kootu e ji mara ndị òtù m. O doro m anya na o juru ụfọdụ Ndịàmà Jehova ahụ anya ịhụ m. Ma, otú ha si nabata m nke ọma n’ụbọchị ahụ tụrụ m n’anya. Obi tọkwara m ụtọ.
N’agbanyeghị na amụwala m Baịbụl, mụ na ndị òtù m ahụ ka na-akpa. Ma ihe m na-amụta na Baịbụl mechara jiri nwayọọ nwayọọ na-eru m n’obi. M chọpụtara na ọ bụrụ na m chọrọ ife Jehova, m kwesịrị ịhapụ ndị òtù m ahụ ma sepụ aka n’ọgba aghara ahụ. Ọ dịrịghị m mfe ime otú ahụ. Ma m mechara mee ya n’ihi ihe ndị m na-amụta na Baịbụl nakwa n’ihi ike Jehova nyere m. M kpụrụ ntutu m, kwụpụ ọla ntị ahụ m na-akwụ, ma zụọ ezigbo kootu. Ihe ndị m na-amụta na Baịbụl mekwara ka m malite ịkwanyere ndị ọzọ ùgwù.
URU NDỊ M RITERELA: M kpara arụ ma yie ndị mmadụ egwu n’oge ndị gara aga. Ndị uwe ojii na ndị agha e nwere n’ebe anyị bi ma na m bụ onye ọjọọ. Dị ka ihe atụ, oge mbụ m gara mgbakọ distrikti nke Ndịàmà Jehova nwere n’obodo a na-akpọ Navan, ndị uwe oji so m si na Nọtan Ayaland gaa Ayaland, sokwara m lọta. Ma ugbu a, ndụ m agbanweela. O nweghịzi onye uwe ojii na-eso m ma m gawa mgbakọ ma ọ bụ ebe ọ bụla ọzọ. Mụ na Ndịàmà Jehova ibe m, ma Paul ma Bill, na-esokwa aga ekwusara ndị mmadụ ozi ọma.
Mgbe m gbanwere otú m si ebi ndụ, Ndịàmà Jehova mụ na ha nọ n’ọgbakọ bịara na-akpachi anya. Ọ bụ mgbe ahụ ka mụ na otu Onyeàmà Jehova aha ya bụ Louise malitere ịdị ná mma. Anyị mechakwara lụọ. Nwa m nwoke ahụ mechakwara lọta n’ụlọ anyị.
Mgbe ọ bụla m chetara ụdị ndụ m biri n’oge gara aga, ọ na-ewute m na m kpataara ndị mmadụ ahụhụ na nsogbu. Ma ihe niile mere ná ndụ m gosiri na Baịbụl na-agbanwe ndụ ndị mmadụ. O nwere ike ime ka onye na-ebi ndụ na-enweghị isi otú m biri malite iji ndụ ya na-eme ihe bara uru ma nweekwa olileanya na ihe ga-adị mma n’ọdịnihu.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 12 Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara akwụkwọ a, ma a naghịzi ebipụta ya.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 12]
Ezigbo iwe were mama m mgbe ọ nụrụ na m na-agụ Baịbụl