Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

‘Ka Udo Dịrị Ndị Chineke Meere Amara’

‘Ka Udo Dịrị Ndị Chineke Meere Amara’

‘Ka Udo Dịrị Ndị Chineke Meere Amara’

“Ka otuto dịrị Chineke n’ebe kasị elu, ka udo dịkwa n’elu ụwa n’etiti ndị Chineke meere amara.”—LUK 2:14.

Ihe mere ụfọdụ ndị ji agba Krismas.

Na Krismas afọ ọ bụla, poopu na ndị isi okpukpe ndị ọzọ na-ekwu okwuchukwu. Ha na-ekwu maka udo n’okwuchukwu ha, ha na-ekpekwa ekpere ka e nwee udo n’ụwa. Ha na-atụ anya na ihe ahụ mmụọ ozi kwuru n’oge a mụrụ Jizọs ga-emezu n’oge Krismas. Mmụọ ozi ahụ kwuru, sị: “Ka udo dịkwa n’elu ụwa n’etiti ndị Chineke meere amara.” Ụfọdụ ndị na-aga n’ebe ndị a kpọrọ ala nsọ ka ha nọrọ n’ebe ndị ahụ gbaa Krismas.

Gịnị mere udo anaghị adịcha n’ọtụtụ ebe n’oge Krismas?

Udo anaghị adịcha n’ọtụtụ ebe n’oge Krismas. Dị ka ihe atụ, n’ọnwa Disemba n’afọ 1914, mgbe Agha Ụwa nke Mbụ kpụ ọkụ n’ọnụ na Yurop, ndị agha Briten na ndị agha Jamanị si n’ebe ndị ha nọ na-akwa mgbọ pụta ma nọrọ otu ebe gbakọọ Krismas ọnụ. Ha rikọrọ nri ọnụ, ṅụkọọkwa mmanya na sịga. Ha gbadịrị bọl. Ma ọ dị mwute na ha malitekwara ịkwarịta mgbọ n’oge na-adịghị anya. N’otu akwụkwọ ozi onye agha Briten dere, ọ kọrọ na otu onye agha Jamanị gwara ya, sị: “Anyị nọ n’udo taa. Ma, o ruo echi, anyị amalitekwa igburịta ibe anyị maka na ị na-alụrụ mba gị agha, mụ ana-alụrụ mba nke m.”

Otú ihe Baịbụl kwuru ga-esi nyere gị aka.

“A mụworo anyị otu nwa . . . A ga-akpọ ya . . . Onyeisi Udo. Mgbasa ịchịisi ya na udo ya ga-agbasa agaghị enwe ọgwụgwụ.” (Aịzaya 9:6, 7) Ọ̀ bụ na amụma a e buru banyere Jizọs Kraịst emeghị ka obi sie gị ike na a ga-enwe udo n’ụwa? A mụghị Jizọs n’ụwa ka ọ na-eweta udo n’ụwa naanị otu ụbọchị n’afọ. Ebe ọ bụ Eze n’eluigwe, ọ ga-eme ka e nwee ezigbo udo n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi.

“Agwawo m unu ihe ndị a ka unu wee site na mụ [ya bụ, Jizọs] nwee udo. N’ụwa, unu na-enwe mkpagbu, ma nweenụ obi ike! Emeriwo m ụwa.” (Jọn 16:33) Jizọs na-enyedịrị ndị na-eso ụzọ ya aka n’oge a ka ha na ibe ha dịrị n’udo. N’eziokwu, Ndị Kraịst na-enwe mkpagbu. Ma Baịbụl emeela ka ha ghọta ihe mere ndị mmadụ ji na-ata ahụhụ na otú Jizọs ga-esi mee ka udo dịrị n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi. Nke a emeela ka obi ruo ha ala.

Ndịàmà Jehova dị n’otu n’ụwa niile n’agbanyeghị na ha si ná mba dị iche iche, asụsụ ha na-asụ na ụcha akpụkpọ ahụ́ ha abụghịkwa otu. Ihe mere ha ji dịrị n’otu bụ maka na ha na-eme ihe Jizọs kwuru. Ọ bụrụ na ị gaa n’ebe ha na-amụ Baịbụl, ị ga-ahụ na nke a bụ eziokwu. Ọtụtụ ndị achọpụtala na udo dị n’etiti Ndịàmà Jehova ka udo ọ bụla nwere ike ịdịtụ n’oge Krismas mma. I nwekwara ike ịchọpụta otu ihe ahụ.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 8]

Ndịàmà Jehova dị n’otu n’ụwa niile n’agbanyeghị na asụsụ ha na-asụ na ụcha akpụkpọ ahụ́ ha abụghị otu. Ị gaa n’ebe ha na-amụ Baịbụl, ị ga-ahụ na nke a bụ eziokwu