Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 ṄOMIE OKWUKWE HA

‘Ọ Na-ekwu Okwu, Ọ Bụ Ezie na Ọ Nwụrụ Anwụ’

‘Ọ Na-ekwu Okwu, Ọ Bụ Ezie na Ọ Nwụrụ Anwụ’

KA EBEL nọ na-elekọta ìgwè atụrụ ya ndị na-ata ahịhịa n’akụkụ ugwu, ọ ga-abụ na o lepụrụ anya hụ otu ihe na-egbuke ka ọkụ. Ọ ma na e nwere mma agha na-egbukepụ ọkụ n’ebe ahụ. Mma agha a na-echigharị echigharị n’onwe ya ma na-eche ụzọ e si abanye n’ogige Iden nche. Nne na nna ya bibu n’ebe ahụ. Ma, ha na ụmụ ha enweghị ike ịbanye ebe ahụ ugbu a. Were ya na ị na-ahụ ebe ikuku mgbede nọ na-ekusasị ntutu isi Ebel ka o leliri anya na-eche banyere Onye kere ya. O nwere ike ịbụ na ọ na-eche, sị, ‘Mmadụ na Chineke hà ga-emecha dị ná mma?’ Obi ga-atọgbu Ebel atọgbu ma nke a mee.

Ebel na-agwa gị okwu taa. Ị̀ na-anụ ihe ọ na-agwa gị? I nwere ikwu na nke a emekataghị mee. A sị ka e kwuwe, Ebel bụ nwa nke abụọ Adam na Iv mụrụ, ọ nwụọkwala kemgbe. O rekasịchaala ma ghọọ ájá kemgbe ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ puku afọ isii gara aga. Baịbụl kwuru banyere ndị nwụrụ anwụ, sị: ‘Ha amaghị ihe ọ bụla ma ọlị.’ (Ekliziastis 9:5, 10) Ihe ọzọkwa bụ na e nweghị otu mkpụrụ okwu Ebel kwuru nke e dere na Baịbụl. Ebe ọ dị otú ahụ, oleezi otú o si na-agwa anyị okwu?

Pọl onyeozi si n’ike mmụọ nsọ Chineke dee banyere Ebel, sị: “O sitekwara na ya na-ekwu okwu, ọ bụ ezie na ọ nwụrụ anwụ.” (Ndị Hibru 11:4) Ọ̀ bụ gịnị ka Ebel si na ya na-ekwu okwu? O si n’okwukwe ya. Ebel bụ mmadụ mbụ nwere okwukwe na Chineke. Okwukwe Ebel siri ezigbo nke na n’agbanyeghị na ọ nwụọla, a ka ji ya ama atụ, ọ bụkwa ụdị okwukwe ahụ ka anyị kwesịrị inwe taa. Ọ bụrụ na anyị amụta ihe n’okwukwe Ebel ma gbalịa inwe ụdị okwukwe ahụ o nwere, e nweziri ike ikwu na Ebel na-agwa anyị okwu taa.

Oleekwanụ ihe anyị nwere ike ịmụta banyere Ebel ebe ọ bụ na Baịbụl ekwughị ọtụtụ ihe banyere ya? Ka anyị hụ.

MGBE EBEL BỤ NWATA

Ebel so ná ndị mbụ dịrị ndụ n’ụwa n’ihi na a mụrụ ya obere oge Chineke kechara mmadụ n’ụwa. Jizọs mechara kwuo na Ebel dịrị ndụ “mgbe a tọrọ ntọala ụwa.” (Luk 11:50, 51) O doro anya na ụwa Jizọs kwuru okwu ya n’amaokwu a bụ ụmụ mmadụ ndị nwere olileanya na a ga-agbapụta ha ná mmehie. Ọ bụ eziokwu na Ebel bụ onye nke anọ dịrị ndụ n’ụwa, ma ọ dị ka ọ̀ bụ ya bụ onye mbụ Chineke weere na e nwere ike ịgbapụta ná mmehie. * O doro anya na nne na nna Ebel na nwanne ya nwoke enweghị ihe ha ji Chineke kpọrọ.

N’agbanyeghị na ọ dịbeghị anya ụmụ mmadụ malitere ịdị ndụ n’ụwa, ha amalitela ịtagbu onwe ha n’ahụhụ. Ọ ga-abụ na Adam na Iv, bụ́ nne na nna Ebel, mara ezigbo mma, gbasiekwa ike. Ma ha ma na ha adịghịzi otú ha dị na mbụ. Ha zuburu okè, nweekwa olileanya ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. Ma ha nupụụrụ Jehova Chineke isi, ya achụpụ ha n’ebe obibi ha bụ́ paradaịs nke dị n’ogige Iden. Ebe ọ bụ na ihe ka Adam na Iv mkpa bụ ime ihe dị hanwa mma, ha egeghị Chineke ntị n’agbanyeghị nsogbu nnupụisi ha ga-akpatara ụmụ ha. Ọ bụ otú ahụ ka ha si ghọọ  ndị na-ezughị okè, gharazie inwe olileanya ịdị ndụ ebighị ebi.—Jenesis 2:15–3:24.

Chineke chụpụrụ Adam na Iv n’ogige Iden, ha amalitezie ịtagbu onwe ha n’ahụhụ. N’agbanyeghị nke ahụ, mgbe ha mụrụ nwa mbụ ha, ha kpọrọ ya Ken ma ọ bụ “Onye A Mụrụ Amụ.” Iv kwuru, sị: “Amụtawo m nwoke site n’enyemaka Jehova.” Ihe a o kwuru gosiri na ọ ga-abụ nkwa Jehova kwere n’ogige Iden ka o bu n’obi gụọ nwa ya aha ahụ. Jehova kwere nkwa n’oge ahụ na a ga-enwe otu nwaanyị nke a ga-esi n’aka ya nweta otu “mkpụrụ” nke ga-emecha bibie ajọ onye ahụ nke duhiere Adam na Iv. (Jenesis 3:15; 4:1) Ọ̀ ga-abụ na Iv chere na ọ bụ ya bụ nwaanyị ahụ e kwuru okwu ya n’amụma ahụ, Ken abụrụkwa “mkpụrụ” ahụ e kwere ná nkwa?

Ọ bụrụ ihe ahụ ka Iv chere, ọ dara ya. Ọ bụrụkwa ihe ahụ ka ya na Adam kụziiri Ken mgbe ọ na-eto, o nweghị aka ha nyeere ya. Kama nke ahụ, ha mere ka isi buwe ya. Iv mechakwara mụta nwa nwoke ọzọ, ma ọ gụghị ya oké aha otú ahụ ọ gụrụ Ken. Ha gụrụ ya Ebel. Ọ ga-abụ na ihe aha a pụtara bụ “Ume E Kupụrụ Ekupụ” ma ọ bụ “Ihe Efu.” (Jenesis 4:2) Ọ̀ ga-abụ na aha a ha gụrụ Ebel gosiri na ha na-eche na Ken ga-aka ya baa uru? Anyị amaghị.

Ma, ndị nne na nna nwere ike ịmụta ihe n’ihe ahụ Adam na Iv mere. Otú i si akpa àgwà na ihe ị na-ekwu ọ̀ na-eme ka ụmụ gị bụrụ ndị mpako, ndị nwere oké ọchịchọ ma ọ bụ ndị na-achọ ihe ga-abara naanị onwe ha uru? Ka ị̀ na-eji okwu ọnụ gị na àgwà gị akụziri ha ka ha hụ Jehova Chineke n’anya ma na-agbalị ka ha na ya dịrị ná mma? Ọ dị mwute na Adam na Iv emeghị otú ahụ. Ma, ụmụ ha ka nwere olileanya.

IHE NYEERE EBEL AKA INWE OKWUKWE NA CHINEKE

Ka Ken na Ebel na-etolite, ọ ga-abụ na Adam kụziiri ha ọrụ ha ga na-arụ ka ezinụlọ ha nweta ihe ha ga-eri. Ken ghọrọ onye ọrụ ubi, Ebel aghọọ onye na-azụ atụrụ.

Ka oge na-aga, Ebel mere ihe dị mkpa karịa ịzụ atụrụ. Ka ọtụtụ afọ na-agafe, ọ bịara nwee okwukwe na Chineke. Pọl mechara dee banyere okwukwe ahụ Ebel nwere. Chebagodịrị ihe a echiche. O nweghị mmadụ ọ bụla Ebel nwere ike isi n’aka ya mụta ezigbo ihe. Oleezi otú o si nwee okwukwe na Jehova Chineke? Ka anyị tụlee ihe atọ nwere ike inyere Ebel aka inwe okwukwe na Chineke.

Ihe ndị Jehova kere.

Jehova bụrụ ala ọnụ, ya emee ka ịkọ ihe n’ala ghara ịdị mfe n’ihi ogwu na uke ndị juru na ya. N’agbanyeghị nke ahụ, ala ka na-emepụta ihe Adam na Iv na ụmụ ha na-eri. Jehova abụghịkwa anụmanụ, nnụnụ na azụ̀ ọnụ, o nwekwanụghị ọnụ ọ bụrụ ọdọ mmiri, oké osimiri, mbara ígwé, ígwé ojii, anyanwụ, ọnwa na kpakpando. Ebe ọ bụla Ebel lere anya, ọ na-ahụ ihe ndị gosiri na Jehova Chineke, bụ́ onye kere ihe niile, nwere amamihe, na-emekwara ihe ndị o kere eke ihe ọma ma hụ ụmụ mmadụ n’anya. (Ndị Rom 1:20) Mgbe o chebaara ihe ndị ahụ echiche, ha mere ka okwukwe ya sikwuo ike.

Ọ ga-abụrịrị na Ebel wepụtara oge chebara ụdị onye Jehova bụ echiche. Were ya na ị na-ahụ ya ka ọ na-azụ atụrụ ya. Onye ọzụzụ atụrụ anaghị anọ otu ebe. Ọ na-akpọrọ atụrụ ndị ọ na-azụ rịa ugwu, gafee ndagwurugwu na iyi ma gaa n’ebe ahịhịa ndụ juru eju nakwa n’ebe ha ga-aṅụju mmiri afọ.  Ọ na-akpọkwa ha aga n’ebe ndị mara mma ha ga-anọ zuru ike. A bịa n’ụmụ anụmanụ niile Chineke kere, ọ dị ka ọ̀ bụ atụrụ kacha bụrụ nke na-agbasighị ike, dị ka à ga-asị na Chineke kere ha ka mmadụ na-elekọta ma na-echebe ha. Ọ̀ ga-abụ na Ebel ghọtara na yanwa kwesịkwara inwe Onye karịrị mmadụ, nke kakwa mmadụ mara ihe, ga na-eduzi ya, na-echebe ya ma na-elekọta ya? Ọ ga-abụrịrị na o kpere ekpere banyere ihe ndị ahụ, ekpere ahụ mekwara ka okwukwe ya sikwuo ike.

Ihe e kere eke ndị Ebel hụrụ mere ka o nwee okwukwe siri ike na Chineke

Nkwa ndị Jehova kwere.

Ọ ga-abụ na Adam na Iv kọọrọ ụmụ ha ihe ha mere n’ogige Iden nke mere Jehova ji chụpụ ha. N’ihi ya, Ebel nwere ọtụtụ ihe ọ ga-echebara echiche.

Jehova kwuru na ya abụọla ala ọnụ. Ebel ji anya ya hụ na ihe Jehova kwuru emezuola, n’ihi na ọ na-ahụ ka ogwu na uke na-epupụta n’ala. Jehova kwukwara na Iv ga-enwe ihe mgbu mgbe ọ dị ime na mgbe ọ na-amụ nwa. Ọ bụrụ na Ebel hụrụ mama ya ka ọ na-amụ nwa, o doro anya na ọ ga-aghọta na ihe Jehova kwuru bụ eziokwu. Jehova gwara Iv na ọ ga na-agụ ya agụụ otú na-ekwesịghị ekwesị ka di ya hụ ya n’anya ma na-elebara ya anya. Ọ gwakwara ya na Adam ga na-achị ya. Ebel hụkwara ihe na-aga n’etiti mama ya na papa ya ma mara na ihe a Jehova gwara Iv emezuola. Ebel chọpụtara na ihe niile ahụ Jehova kwuru mezuchara. Ihe ndị ahụ mere ka Ebel kwenyesie ike na nkwa ahụ Jehova kwere banyere mkpụrụ ahụ nke ga-abịanụ ga-emezurịrị. Otu ụbọchị, “mkpụrụ” ahụ ga-edozi nsogbu niile nnupụisi Adam na Iv kpatara.—Jenesis 3:15-19.

Ndị na-ejere Jehova ozi.

Ọ bụ eziokwu na o nweghị mmadụ nọ n’ụwa n’oge ahụ nke Ebel nwere ike isi n’aka ya mụta ezigbo ihe. Ma, e nwere ndị mmụọ ozi nọ n’ụwa mgbe ahụ ndị Ebel nwere ike isi n’aka ha mụta ihe. Mgbe Jehova chụpụchara Adam na Iv na paradaịs, Jehova mere ihe ga-eme ka ma Adam na Iv ma ụmụ ha ghara ịbanye ebe ahụ. Jehova mere ka ndị cherọb na-eche ọnụ ụzọ ogige ahụ nche. Ndị cherọb bụ ndị mmụọ ozi ọkwá ha dị elu. Jehova debekwara mma agha na-egbukepụ ọkụ, nke na-echigharị mgbe niile, n’ebe ahụ.—Jenesis 3:24.

Were ya na ị na-ahụ Ebel ka ọ na-ahụ ndị cherọb ahụ mgbe ọ bụ nwata. Ebe ọ bụ na ndị cherọb ahụ nwoghara ma dịrị ka ụmụ mmadụ, otú ha dị n’anya ga-eme ka Ebel mara na ha siri ezigbo ike. “Mma agha” ahụ nke na-egbukepụ ọkụ ma na-echigharị mgbe niile mekwara ka Ebel na-atụ egwu Chineke. Ka Ebel na-eto, ò nwere mgbe ọ hụrụ ka ike ịnọ n’ọnụ ụzọ ogige ahụ gwụrụ ndị cherọb ahụ, ha esizie ebe ahụ ha nọ pụọ? Mba. Ndị cherọb ahụ, bụ́ ndị ma ihe ma nwee ọgụgụ isi, nọ ebe ahụ ma n’ụtụtụ ma n’abalị, site n’afọ ruo n’afọ. Ọ dịtụghị mgbe ha hapụrụ ebe ahụ Jehova sịrị ha nọrọ. Nke a mere ka Ebel mara na Jehova Chineke nwere ndị na-erubere ya isi ma jiri ọrụ ha kpọrọ ihe. Ebel ghọtara na ndị cherọb ahụ na-erubere Jehova isi ma kwesị ntụkwasị obi, ma o nweghị onye nọ n’ezinụlọ ha na-erubere Chineke isi. O doro anya na àgwà ndị mmụọ ozi ahụ mere ka okwukwe Ebel sikwuo ike.

N’oge niile Ebel dịrị ndụ, ọ hụrụ na ndị cherọb ahụ rubeere Jehova isi

Ebel chebaara ihe ndị Jehova kere eke echiche bụ́ ndị Jehova ji eme ka anyị mata ụdị onye ọ bụ. O chebakwaara nkwa ndị Chineke kwere echiche, nakwa otú ndị cherọb ahụ si na-erubere Chineke isi. Ihe ndị a mere ka okwukwe ya sikwuo ike. O doro anya na e nwere ọtụtụ ihe anyị ga-amụta n’aka ya. Nke ka nke bụ na ndị na-eto eto nwere ike ịmụta na ha ga-enweli ezigbo okwukwe na Jehova Chineke n’agbanyeghị ihe ndị ezinụlọ ha na-eme. Anyị nwekwara ihe ndị ga-eme ka okwukwe anyị sikwuo ike. Ihe ndị ahụ bụ ihe ndị magburu onwe ha Chineke kere, bụ́ ndị anyị na-ahụ ebe niile, nakwa Okwu ya bụ́ Baịbụl na ọtụtụ ndị ohu Chineke ndị nwere okwukwe.

IHE MERE ÀJÀ EBEL CHỤRỤ JI DỊ CHINEKE MMA

Ka Ebel na-enwekwu okwukwe na Jehova, ọ bịara chọwa ihe ọ ga-enye Chineke iji gosi na ya nwere okwukwe. Ma, oleekwanụ ihe mmadụ nkịtị ga-enye Onye kere eluigwe na ala? Nke bụ́ eziokwu bụ na enyemaka anyị adịghị Chineke mkpa, o nwekwanụghị ihe o ji onyinye anyị eme. Ma, Ebel ghọtara na ọ bụrụ na ya eburu ezi ihe n’obi nye Jehova ihe kacha mma o nwere, obi ga-atọ Jehova ụtọ.

N’ihi ya, Ebel kpebiri na ya ga-achụrụ Chineke àjà. O si n’ìgwè ewu na atụrụ ya họta ụmụ atụrụ ndị kacha mma, ya bụ, ndị e bụ ụzọ mụọ, ma were ha chụọrọ Chineke àjà. Ken chọkwara ka Chineke gọzie ya. N’ihi ya, o si n’ihe ubi ya weta mkpụrụ ọ ga-eji chụọrọ  Chineke àjà. Ma ihe o bu n’obi chọọ ịchụrụ Chineke àjà dị iche n’ihe Ebel bu n’obi. Ihe merenụ mgbe ụmụnne abụọ ahụ chụụrụ Jehova àjà gosiri na ihe ha bu n’obi dị iche iche.

Ebel ji okwukwe chụọrọ Chineke àjà, ma Ken emeghị otú ahụ

Ọ ga-abụ na ha dosara onyinye ha n’elu ebe ịchụàjà ma mụnye ha ọkụ. Ọ ga-abụkwa na ha nọ n’ebe ndị cherọb ahụ ga na-ahụ ha anya chụọrọ Jehova àjà. Nke ahụ bụ n’ihi na ọ bụ ndị cherọb ahụ bụ naanị ndị na-anọchite anya Jehova n’ụwa n’oge ahụ. Jehova mere ihe! Baịbụl kwuru, sị: “Jehova lere Ebel na onyinye ya anya ọma.” (Jenesis 4:4) Baịbụl ekwughị ihe Jehova mere iji gosi na o lere onyinye Ebel anya ọma. Gịnị mere o ji nabata onyinye Ebel?

Ọ̀ bụ n’ihi ụdị onyinye Ebel nyere ya? Ebel ji ihe dị ndụ nke na-eku ume ma nwee ọbara chụọrọ Jehova àjà. Ọbara anụmanụ ndị ahụ nọchikwara anya ndụ ha. Ebel ọ̀ ma na ụdị àjà ahụ bara ezigbo uru? Ọtụtụ narị afọ Ebel chụchara àjà ahụ, Chineke ji àjà nke e ji nwa atụrụ na-enweghị ntụpọ chụọ tụnyere àjà ọ ga-eji Ọkpara ya zuru okè chụọ, bụ́ onye a kpọrọ “Nwa Atụrụ Chineke,” onye ga-awụsa ọbara ya zuru okè. (Jọn 1:29; Ọpụpụ 12:5-7) Ma, o doro anya na Ebel amaghị nke ahụ.

Ma otu ihe doro anyị anya bụ na Ebel nyere Chineke ihe kacha mma o nwere. Ihe mere Jehova ji nabata àjà ahụ Ebel chụụrụ ya abụghị naanị n’ihi atụrụ o ji chụọrọ ya àjà, kama, ọ bụ n’ihi ụdị mmadụ Ebel bụ. Ebel chụụrụ Jehova àjà n’ihi na ọ hụrụ Jehova n’anya ma nwee okwukwe na ya.

Ma ọ bụghị otú ahụ ka ọ dị Ken. Jehova ‘eleghị Ken na onyinye ya anya ọma.’ (Jenesis 4:5) Ọ bụghị na ihe ahụ Ken ji chụọrọ Jehova àjà adịghị mma. A sị ka e kwuwe, Chineke mechadịrị gwa ụmụ Izrel ka ha jiri ihe ndị ha wetara n’ubi chụọrọ ya àjà. (Levitikọs 6:14, 15) Ma Baịbụl kwuru na ‘ọrụ Ken jọrọ njọ.’ (1 Jọn 3:12) Ọ ga-abụ na Ken chere na ime ka à sịkwa na ọ na-efe Chineke ezuola, otú ahụ ọtụtụ ndị na-emekwa n’oge anyị a. Ihe o mere ozugbo ọ chụchaara Chineke àjà mere ka o doo anya na ọ hụghị Jehova n’anya nakwa na o nweghị okwukwe na ya.

Ò nwere ihe Ken mụtara n’aka Ebel mgbe Ken hụrụ na Jehova anabataghị àjà ọ chụrụ? Mba. Ọ bịadịrị kpọọ Ebel asị n’ime obi ya. Jehova hụrụ ihe dị n’obi Ken ma jiri obiọma gwa ya okwu. Ọ dọrọ Ken aka ná ntị na àgwà ya ga-eme ka o mee mmehie dị oké njọ. O kwekwara Ken nkwa na ọ bụrụ na ọ gbanwee mewe ezi ihe, na ya ‘ga-ebuli ya elu.’—Jenesis 4:6, 7.

Ken egeghị Chineke ntị. Kama ọ kpọrọ nwanne ya nwoke obi ya dị ọcha ka o soro ya gaa n’ọhịa. Mgbe ha ruru ebe ahụ, Ken gburu nwanne ya Ebel. (Jenesis 4:8) E nwere ike ikwu na Ebel bụ onye mbụ nwụrụ n’ihi okwukwe ya. Ọ bụ eziokwu na Ebel anwụọla, a ka na-akọ akụkọ ya ebe niile.

E nwere ike ikwu na ọbara Ebel na-ebesara Jehova ákwá, ya bụ, ka Chineke bọọrọ ya ọbọ. Chineke mekwara otú ahụ. Ọ tara Ken ahụhụ n’ihi ihe ọjọọ ahụ Ken mere. (Jenesis 4:9-12) Ihe kadị mkpa bụ na okwukwe Ebel na-akụziri anyị ihe taa. Ọ bụ eziokwu na Ebel adịteghị ndụ aka ma e jiri ihe dị ka otu narị afọ ọ dịrị ndụ tụnyere afọ ole ndị mmadụ na-adị ndụ n’oge ahụ, ma o ji ndụ ya mee ihe bara uru. Tupu Ebel anwụọ, ọ ma na Nna ya nke eluigwe, bụ́ Jehova, hụrụ ya n’anya. (Ndị Hibru 11:4) N’ihi ya, obi siri anyị ike na Jehova ka na-echeta ya. Ọ ga-akpọlitekwa ya n’ọnwụ mgbe ụwa ga-aghọ paradaịs. (Jọn 5:28, 29) Ị̀ ga-anọ na paradaịs mgbe a ga-akpọlite Ebel n’ọnwụ? I nwere ike ịnọ ya ma ọ bụrụ na i kpebisie ike na ị ga-ege ntị n’ihe Ebel na-agwa anyị ma nwee ụdị okwukwe o nwere.

^ para. 8 Ihe okwu Hibru a sụgharịrị ‘ịtọ ntọala ụwa’ pụtara bụ ịgha mkpụrụ, ya bụ, ịmụ nwa. N’ihi ya, ihe a na-ekwu okwu ya bụ mmadụ mbụ a mụrụ n’ụwa. Ma, ebe ọ bụ Ken bụ nwa mbụ Adam na Iv mụrụ, olee ihe mere Jizọs ji hapụ Ken ma kwuo na Ebel dịrị ndụ “mgbe a tọrọ ntọala ụwa”? Ihe ndị Ken kpebiri ime na ihe ndị o mechara mee gosiri na ọ ma ụma nupụrụ Jehova Chineke isi. N’ihi ya, e nwere ike ikwu na a gaghị azọpụta Ken ma ọ bụ kpọlite ya n’ọnwụ otú ahụ a na-agaghị akpọlite nne na nna ya, bụ́ Adam na Iv.