Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
Olee ụdị onye Chineke bụ?
Chineke bụ mmụọ. Mmadụ enweghị ike ịhụ ya anya. Ọ bụ ya kere eluigwe, ụwa, na ihe niile dị ndụ. Ma, o nweghị onye kere Chineke n’ihi na o nweghị mmalite. (Abụ Ọma 90:2) Chineke chọrọ ka ụmụ mmadụ gbalịa ka ha na ya dịrị ná mma nakwa ka ha mata nke bụ́ eziokwu gbasara ya.—Gụọ Ọrụ Ndịozi 17:24-27.
Anyị nwere ike ịmata aha Chineke. Anyị nwekwara ike ịmata àgwà ya ụfọdụ ma ọ bụrụ na anyị echebara ihe ndị o kere eke echiche. (Ndị Rom 1:20) Ma, ọ bụrụ na anyị chọrọ ịmata Chineke nke ọma, ihe anyị kwesịrị ime bụ ịmụ Okwu ya, bụ́ Baịbụl. Baịbụl ga-eme ka anyị mata àgwà ọma ndị Chineke nwere.—Gụọ Abụ Ọma 103:7-10.
Mmegbu ndị mmadụ na-emegbu ibe ha ọ̀ na-ewute Chineke?
Mmegbu ndị mmadụ na-emegbu ibe ha na-ewute Onye kere anyị, bụ́ Jehova. O kere ụmụ mmadụ n’onyinyo ya. (Diuterọnọmi 25:16) Ọ bụ ya mere mmegbu anaghị adị ọtụtụ ndị mma. Ọ bụghị Chineke kpatara mmegbu ma ọ bụ ihe ọjọọ anyị na-ahụ ebe niile. Chineke kere ụmụ mmadụ ka ha na-ekpebiri onwe ha ihe ha chọrọ ime. Ma, ọ dị mwute na ọtụtụ ndị họọrọ ime ihe ọjọọ ma na-emegbu ndị ọzọ. Ihe ọjọọ ndị ha na-eme ‘na-ewute Jehova n’obi.’—Gụọ Jenesis 6:5, 6; Diuterọnọmi 32:4, 5.
Jehova hụrụ ikpe ziri ezi n’anya. Ọ gaghị ekwe ka mmegbu dịgide. (Abụ Ọma 37:28, 29) Baịbụl gwara anyị na Chineke ga-eme ka mmegbu niile ndị mmadụ na-emegbu ibe ha kwụsị n’oge na-adịghị anya.—Gụọ 2 Pita 3:7-9, 13.
Baịbụl gwara anyị na Chineke ga-eme ka mmegbu niile ndị mmadụ na-emegbu ibe ha kwụsị n’oge na-adịghị anya