Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Gịnị ka alo a kọrọ akụkọ ya na Baịbụl bụ?

A na-esi n’osisi Agawud enweta alo

Baịbụl kwuru na e ji alo eme ka uwe na ihe ndina na-esi ísì ọma. (Abụ Ọma 45:8; Ilu 7:17; Abụ Sọlọmọn 4:14) Ọ ga-abụ na a na-esi n’osisi a na-akpọ agawud enweta alo ndị ahụ. Ọ na-abụ osisi a bido ire ure, ọ na-agbapụta mmanụ na esó na-esi ísì ọma. A na-egweri osisi ahụ nke ọma, ya adị ka nzụ, e resịwezie ya ndị mmadụ. Ọ bụ osisi ahụ e gweriri nke ọma bụ “alo.”

Baịbụl kwuru na ụlọikwuu ụmụ Izrel yiri “ahịhịa alo nke Jehova kụrụ.” (Ọnụ Ọgụgụ 24:5, 6) O nwere ike ịbụ otú osisi agawud na-adị mere Baịbụl ji kwuo ihe a. Osisi ahụ na-etopụ etopụ. Ogo ya nwere ike iru mita iri atọ, akwụkwọ ya na-agbasakwa agbasa. Ọ bụ eziokwu na e nwekwaghị osisi a ugbu a n’Izrel, ma otu akwụkwọ nke na-akọwa okwu ndị dị na Baịbụl kwuru na “e nweghị ihe mere a ga-eji ekwu na osisi a na osisi ndị ọzọ ndị mmadụ na-amaghị ugbu a adịghị na ndagwurugwu Jọdan n’oge ahụ.”

Olee ụdị onyinye Chineke chọrọ ka ndị mmadụ na-eweta n’ụlọ nsọ ya dị na Jeruselem?

A hụrụ ihe a e ji ájá kpụọ n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem. o ruola ihe dị ka puku afọ abụọ

Chineke nyere ụmụ Izrel iwu na onyinye niile ha ga-eweta n’ụlọ nsọ ya kwesịrị ịbụ ndị kacha mma. Chineke achọghị onyinye rụrụ arụ, ọ chọghịkwa ka ha jiri anụmanụ nwere nkwarụ chụọrọ ya àjà. (Ọpụpụ 23:19; Levitikọs 22:21-24) Otu onye Juu aha ya bụ Faịlo, onye dere akwụkwọ n’ihe dị ka puku afọ abụọ gara aga, kwuru na n’oge ahụ, ndị nchụàjà na-enyocha anụmanụ niile, ‘si n’isi ruo n’ọdụ,’ iji hụ na anụmanụ a ga-eji chụọ àjà enweghị “ntụpọ ma ọ bụ nkwarụ ọ bụla.”

Otu ọkachamara aha ya bụ E. P. Sanders kwuru na o nwere ike ịbụ na ndị na-arụ ọrụ n’ụlọ nsọ “nyere ndị a tụkwasịrị obi na-ere anụmanụ n’ụlọ nsọ iwu ka ha na-ere naanị anụmanụ na nnụnụ ndị nchụàjà nyocharala ma chọpụta na ha enweghị nkwarụ. Ebe ọ dị otú a, ndị na-ere anụmanụ na-enye ndị zụrụ anụmanụ ihe dị ka risit iji gosi na anụmanụ ha resịrị ha enweghị nkwarụ.”

N’afọ 2011, ndị na-amụ banyere ihe ndị mgbe ochie hụrụ ụdị risit ahụ. Ha hụrụ ya n’akụkụ ụlọ nsọ dị na Jeruselem. E ji ájá kpụọ ya. Ọ hà ka mkpụrụ ego, e dekwara ya ihe n’elu. Ọ bụ n’ihe dị ka puku afọ abụọ gara aga ka a kpụrụ ya. Ihe a sụgharịrị mkpụrụ okwu Arameik abụọ e dere n’elu ya bụ: ‘Onyinye A Dị Ọcha Ka E Nye Ya Chineke.’ A sịrị na ọ ga-abụ na ndị na-arụ ọrụ n’ụlọ nsọ na-ewere risit ahụ konye n’ihe ndị dị ka achịcha, ọka ma ọ bụ anụmanụ a chọrọ iji chụọ àjà.