Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara

Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara

Gịnị ka Jizọs ga-eme n’ọdịnihu?

Mgbe Jizọs nwụrụ n’afọ 33, a kpọlitere ya n’ọnwụ, ya alaghachi n’eluigwe. Mgbe ọtụtụ afọ gafere, e chiri ya eze n’eluigwe. (Daniel 7:13, 14) Ebe ọ bụ na e chiela Jizọs eze, ọ ga-eme ka udo dịrị n’ụwa n’ọdịnihu, meekwa ka a ghara inwe onye ga-ada ogbenye.—Gụọ Abụ Ọma 72:7, 8, 13.

Ebe ọ bụ na e chiela Jizọs eze, ọ ga-eme ka ihe ọjọọ kwụsị n’ụwa

Mgbe Jizọs ga-achịwa ụwa, ọ ga-arụ ọtụtụ ọrụ ebube. Ọ ga-eji ike Nna ya nyere ya mee ka ụmụ mmadụ zuo okè. N’oge ahụ, ụwa ga-atọ ụmụ mmadụ ụtọ n’ihi na e nweghịzi onye ga na-anwụ anwụ ma ọ bụ na-aka nká.—Gụọ Jọn 5:26-29; 1 Ndị Kọrịnt 15:25, 26.

Gịnị ka Jizọs na-eme ugbu a?

N’oge anyị a, Jizọs na-ahazi ọrụ ikwusa ozi ọma nke ezigbo ndị na-eso ụzọ ya na-arụ n’ụwa niile. Ndị na-eso ụzọ ya na-akụziri ndị mmadụ ihe Baịbụl kwuru banyere Alaeze Chineke. Jizọs kwuru na ya ga na-enyere ndị na-eso ụzọ ya aka n’ọrụ a ha na-arụ ruo mgbe Alaeze Chineke ga-ewepụ ọchịchị ụmụ mmadụ.—Gụọ Matiu 24:14; 28:19, 20.

Jizọs ji ezigbo ọgbakọ Ndị Kraịst na-akụziri ndị mmadụ otú ka mma ha kwesịrị isi na-ebi ndụ. Ọ ga na-enyere ha aka ruo mgbe e bibiri ụwa ọjọọ a, bụ́ mgbe ụwa ga-aghọ paradaịs otú Chineke kwere ná nkwa.—Gụọ 2 Pita 3:7, 13; Mkpughe 7:17.