Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

BAỊBỤL NA-AGBANWE NDỤ NDỊ MMADỤ

M Na-eji Égbè M Aga Ebe Ọ Bụla M Na-aga

M Na-eji Égbè M Aga Ebe Ọ Bụla M Na-aga
  • A MỤRỤ M N’AFỌ: 1958

  • ABỤ M ONYE: ỊTALI

  • NDỤ M BIRI: ANỌBU M N’ÒTÙ NDỊ NA-EME IHE IKE

NDỤ M BIRI NA MBỤ:

A mụrụ m n’obodo Rom, ọ bụkwa ebe ahụ ka m nọ too. Ebe anyị bi bụ n’ebe ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha bi. Ihe siiri anyị ezigbo ike. Amaghị m onye mama m bụ, mụ na papa m adịghịkwa ná mma. Mgbe m na-eto, mụ na ndị ọjọọ kpawara. Ọ bụ otú ahụ ka m si kpawazie àgwà ka ndị agboro.

M bidoro izu ohi mgbe m na-erubeghị afọ iri. Mgbe m dị afọ iri na abụọ, m si n’ụlọ anyị gbapụ. Ihe ahụ bụ nke mbụ m gbapụrụ n’ụlọ anyị. Papa m bịara ihe dị ka ugboro abụọ n’isi ụlọ ọrụ ndị uwe ojii kpọrọ m laa n’ụlọ. Mụ na ndị mmadụ na-esekarị okwu. Oge niile na-abụrụ m tigbuo zọgbuo. O nweghịkwa onye mụ na ya na-adị ná mma. Mgbe m dị afọ iri na anọ, m gbapụrụ n’ụlọ kpamkpam. M bidoro ṅụwa ọgwụ ọjọọ, birikwa n’okporo ámá. Ebe ọ bụ na enweghị m ebe m na-ehi ụra, m na-akpaka ụgbọala, banye na ya hie ụra. O ruo isi ụtụtụ, mụ apụta gaa chọọ ebe e nwere mmiri ọṅụṅụ ma jiri ya kwọọ ihu na aka.

M ghọrọ aka ochie n’izu ohi. M na-adọnara ndị mmadụ akpa ha, na-agakwa n’ụlọ ndị mmadụ n’abalị ezu ohi. A bịara mara m ka onye ọjọọ. O teghị aka, ndị nọ n’òtù ọjọọ akpọọ m ka m soro ha. Mgbe m sowere ha, m zuweziri ohi n’ụlọ akụ̀. Ebe ọ bụ na m na-esi ọnwụ, ndị òtù m bidoro kwanyewere m ùgwù. M na-eji égbè m aga ebe ọ bụla m na-aga. M na-etinyedị ya n’okpuru pilo m ma m chọọ ihi ụra. Ihe e ji mara m bụ ime ihe ike, ịṅụ ọgwụ ọjọọ, izu ohi, ikwu okwu ọjọọ, na ibi ndụ rụrụ arụ. Ndị uwe ojii na-achọgharị m mgbe niile. Ha nwụchiri m ọtụtụ ugboro. Ọ na-abụ m pụta n’ụlọ mkpọrọ, tupu a mara ihe na-emenụ, mụ emeekwa ihe ọjọọ ọzọ, a tụọkwa m mkpọrọ. Ihe a megidere ruo ọtụtụ afọ.

OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M:

E nwere mgbe m si n’ụlọ mkpọrọ pụta, mụ asị ka m gaa leta nwanne mama m. Amaghị m na ya na ụmụ ya abụọ aghọọla Ndịàmà Jehova. Ha gwara m ka m soro ha gaa ọmụmụ ihe ha. Ebe ọ bụ na m chọrọ ịmata otú ha si amụ ihe, m sooro ha gaa. Mgbe anyị rutere n’ebe ha na-amụ ihe, m siri ọnwụ na m ga-anọ n’ebe dị nso n’ọnụ ụzọ ka m na-ahụ ndị na-abata abata na ndị na-apụ apụ. M jikwa égbè m.

Ọmụmụ ihe ahụ m gara mere ka ndụ m gbanwee. Ọ dị m ka m̀ nọ n’ụwa ọzọ. Ndị bịara kelee m kelere m nke ọma, mụmụọkwara m ọnụ ọchị. M ka na-echeta otú Ndịàmà Jehova ahụ m hụrụ si nwee obiọma, bụrụkwa ndị ezigbo mmadụ. Otú ha si kpaso m àgwà dị ezigbo iche n’otú ndị ọzọ si akpaso m àgwà.

Ndịàmà Jehova bidoro ịkụziri m Baịbụl. Ihe ndị m na-amụta mere ka o dokwuo m anya na m kwesịrị ịgbanwecha otú m si ebi ndụ. M chebaara ihe e kwuru n’Ilu 13:20 echiche. Ebe ahụ sịrị: “Onye ya na ndị maara ihe na-eje ije ga-ama ihe, ma ihe agaghị agaziri onye ya na ndị nzuzu na-emekọ ihe.” M ghọtara na m kwesịrị ịhapụ òtù ọjọọ ahụ. Ọ dịrịghị m mfe, ma Jehova nyeere m aka, mụ ahapụ òtù ahụ.

M bidoziri ime ihe m na-emetụbeghị, ya bụ, ịna-ejide onwe m ka m ghara ime ihe ọjọọ

M bidoro ileta onwe m anya ka m na-adị mma n’anya. M gbalịsikwara ike kwụsị ịṅụ sịga na ọgwụ ọjọọ. M kpụrụ ogologo ntutu isi m, kwụsị ịgba ọla ntị, kwụsịkwa ikwu okwu ọjọọ. M bidoziri ime ihe m na-emetụbeghị, ya bụ, ịna-ejide onwe m ka m ghara ime ihe ọjọọ.

Kemgbe ụwa m, ịgụ ihe na ịmụ ihe anaghị atọ m ụtọ. N’ihi ya, ọ na-esiri m ike ime ka uche m dịrị n’ihe m na-agụ ma m gụwa Baịbụl. M gbalịsikwuru ike ka uche m na-adị n’ihe m na-agụ, ya emee ka m jirizie nke nta nke nta hụwa Jehova n’anya. Ma, akọnuche m bidoro nyewe m nsogbu. Ọtụtụ mgbe, m na-eche na o nweghị uru m bara, ọ na-adịkwa m ka Jehova agaghị agbaghara m ihe ọjọọ niile m mere. Ihe kasiri m obi n’oge ahụ bụ akụkọ Eze Devid. Jehova gbaghaara ya mmehie ndị dị oké njọ o mere. Ịgụ akụkọ ya nyeere m ezigbo aka.—2 Samuel 11:1–12:13.

Ihe ọzọ siiri m ike bụ ịga n’ụlọ ndị mmadụ zie ha ozi ọma. (Matiu 28:19, 20) Ụjọ na-atụ m na m nwere ike ịhụ onye m mejọrọ n’oge gara. Ma, m ji nwayọọ nwayọọ kwụsị ịtụ ụjọ. Inyere ndị mmadụ aka ka ha mata Nna anyị nke eluigwe, bụ́ onye na-agbaghara ndị mmadụ mmehie ha, bidoro tọwa m ụtọ.

URU NDỊ M RITERELA:

Ihe m mụtara banyere Jehova zọrọ m ndụ. Ọtụtụ ndị mụ na ha na-akpabu anwụọla, e nwekwara ndị nke nọ n’ụlọ mkpọrọ. Ma ndụ m dị m ụtọ ugbu a, m nwekwara olileanya na ihe ga-aka mma n’ọdịnihu. Amụtala m iweda onwe m ala na irube isi. Akwụsịkwala m iwe iwe ọkụ. Ihe ndị a emeela ka mụ na ndị mmadụ na-adị ná mma. M lụọla nwaanyị. Aha ọmarịcha nwunye m bụ Carmen, mụ na ya na-ebikwa n’udo. Obi na-atọ mụ na ya ezigbo ụtọ ịkụziri ndị mmadụ Baịbụl.

M na-arụ ezigbo ọrụ ugbu a. M na-agakwa n’ụlọ akụ̀ mgbe ụfọdụ. Ma, ihe mere m ji aga abụghị ka m zuo ohi, kama ka m mee ka ọ dị ọcha.