IHE E KWURU N’OGE OCHIE NKE KA BARA URU
Na-agbaghara Kpamkpam
IHE BAỊBỤL KWURU: “Na-agbaghara ibe unu kpamkpam ma ọ bụrụ na onye ọ bụla nwere ihe mere ọ ga-eji mee mkpesa megide ibe ya. Ọbụna dị ka Jehova gbaghaara unu kpamkpam, na-emekwanụ otú ahụ.”—Ndị Kọlọsi 3:13.
Gịnị ka ọ pụtara? Baịbụl kwuru na onye mere mmehie dị ka onye ji ụgwọ, nakwa na onye gbaghaara mmadụ mmehie dị ka onye kagburu ụgwọ e ji ya. (Matiu 18:21-35) Otu akwụkwọ kwuru na n’Akwụkwọ Nsọ, okwu Grik a sụgharịrị “ịgbaghara” pụtara “mmadụ ịhapụ ụgwọ e ji ya, ghara ịgba onye ahụ ụgwọ.” Ọ pụtara na anyị gbaghara onye mehiere anyị, anyị agaghị atụwa anya ka ọ taa ahụhụ ihe o mere anyị. Ma, na anyị na-achọ ịgbaghara onye mejọrọ anyị apụtaghị na ihe o mere dị anyị mma, ma ọ bụkwanụ na ọ naghị ewute anyị. Kama, anyị anaghị eburu onye ahụ iwe n’obi, ọ bụrụgodị na anyị nwere ‘ihe mere anyị ga-eji mee mkpesa megide ya.’
Ọ̀ bara uru taa? Ebe anyị niile na-ezughị okè, anyị na-emehie ihe. (Ndị Rom 3:23) Anyị kwesịrị ịna-agbaghara ndị mejọrọ anyị n’ihi na anyị ga-emejọkwa ndị ọzọ, chọwa ka ha gbaghara anyị. Anyị gbaghara onye mejọrọ anyị, ọ na-abara anyị uru. Olee otú o si abara anyị uru?
Anyị jụ ịgbaghara onye mejọrọ anyị, na-eburu ya iwe n’obi, anyị na-akpatara onwe anyị nsogbu. O nwere ike ime ka anyị ghara ịna-enwe obi ụtọ, anyị ana-agara onwe anyị, ndụ ana-agwụkwa anyị ike. O nwekwara ike ime ka anyị daa ezigbo ọrịa. Andrew Steptoe na Dr. Yoichi Chida, bụ́ ndị ọkachamara n’ihe gbasara ahụ́ ike, dere n’otu akwụkwọ na-ekwu gbasara obi mmadụ, sị: “Nchọpụta ndị e mere ugbu a na-egosi na iwe iwe na ibu iwe n’obi nwere ike ime ka obi kụchie mmadụ.”
Oleezi uru ịgbaghara ndị ọzọ na-abara anyị? Ọ bụrụ na anyị agbaghara ndị ọzọ kpamkpam, anyị na ha ga-adị n’udo, ọ ga-emekwa ka anyị na ha na-adịkwu ná mma. Nke ka nke, anyị na-egosi na anyị na-eṅomi Chineke n’ihi na ọ na-agbaghara ndị mmehie kpamkpam ma ha chegharịa, ọ chọkwara ka anyị na-eme ka ya.—Mak 11:25; Ndị Efesọs 4:32; 5:1.